Uju Onwudiwe ebola omeiwu ibe ya ebubo iji karama lụsa ya ọgụ n'Imo steeti

Uju Onwudiwe

Ebe foto si, IGOLO NJABA/Facebook

Onye omeiwu n'Ụlọmeiwu Imo steeti bụ Samuel Otuibe ekwuola na o nweghị ihe na-esere ya na ogbo ya bụ Uju Onwudiwe dịka ya bụ onye na-anọchite Njaba na-ebo ya ebubo iji karama lụsa ya ọgụ.

Onwudiwe degara akwụkwọ mkpesa n'ụlọomeiwu steeti nke a gụpụtara n'ọgbakọ ha, ebe ọ rịọrọ ka e nye Otuibe ntaramahụhụ dịka o boro ebubo iji "karama mmanya na iko mmanya basa ya ọgụ" .

Onwudiwe zigara ndị omeiwu ibe ya akwụkwọ mkpesa ahụ n'ụbọchị Tuzde, kwuru na ọ bụrụ na ndị ụloomeiwu erighi ya iwu n'ime ụbọchị asaa, na ọ ga-ewepụ ya bụ okwu ụlọikpe.

Ihe Samuel Otuibe Kwuru

Samuel Otuibe bụ onye na-anọchite anya mpaghara Ahiazu Mbaise gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ ndị ụlọomeiwu ga-ekwu ma ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị.

Kama o kwuru sị "Ka ọ nọro n'akwụkwọ na enweghị ihe dị etu a mere, Uju bụ nwannem m hụrụ n'anya".

O kwukwara sị "Uju bụ nwanne m nwaanyị, nwanne na nwanne nwereike ise okwu kama ọ bụghị nke mmadụ ikwu na nwanne ya chọrọ igbu ya".

Ọ kọwara na dịka Onwudiwe werela ya bụ okwu wegara ndị ụlọomeiwu, na ọ dịrị ndị ụlọomeiwu ikwu nke bụ eziokwu.

Ihe onyeisi ndị ụlomeiwu Steeti nke Imo steeti nwere ikwu

Chiji Collins

Ebe foto si, Facebook/Hon Chiji Collins

Emeka Ahaneku bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke onyeisi ndị ụlọomeiwu steeti nke Imo steeti bụ Emeka Chiji Collins, agaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu.

Ahaneku kọwara na dịka Onwudiwe dere akwụkwọ mkpesa, na ndị ụlọomeiwu ga-etinye anya na ya bụ akwụkwọ dịka usoro ha siri dị.

Ọ gara n'ihu kọwaa na dịka ha abụọ na-ekwu ihe dị iche iche, na ụlọomeiwu steeti ahụ ga-enyocha ihe mere n'ezie.

Akụko ndị ga-amasị gị: