Imo Police: Agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Obowo Imo Steeti

Akụkọ kachasị

Ọkụ ọgbụgba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ tọrọ atọ na nkpọ (container) bu ha.

Ndị omekaome eche na ha bụ ndị otu nzuzo nọrọ n'ụbọchị Mọnde bụ abalị mbụ nke ọnwa Jụlaị 2019 gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Obowo dị n'Imo Steeti.

Ndị omekaome a chụsara ndị uweojii ole na ole nọ n'ọrụ ma buru ngwa egbe ruru anọ gbafuo.

A sị na mkpa mkpa a mere mgbe ọ fọrọ nkeji iri ka ọ kụọ elekere atọ nke ehihie n'ụbọchị Mọnde.

Ndị ntaakụkọ Punch sị na ha kpọrọ kọmịshịona ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Rabiu Ladodo o wee kwuo na ọ nọ ebe ahụ ugbua.

O kwuru na ọ ga-ezi ozi dịka ihe si eme mgbe na adịghị anya.

Mana mgbe BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Godson Orlando Ikeokwu, o kwuru na nke a mere mana onwetebeghi akụkọ ya n'uju.

N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bu Frank Mba, Mohammed kwuru na ọnwụ ndị uweoji ahụ agaghi abụ ihe nkiti.

RUGA agaghị enwe isi ebe a

Gọvanọ Ebọnyị Steeti Dave Umahi

Ebe foto si, Dave Umahi

Nkọwa foto, Gọvanọ Ebọnyị Steeti Dave Umahi

Govanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi ekwuola na onweghi steeti ọbụla n'ọwụwa anyanwụ so n'atụmatụ RUGA.

Umahi kọwara na ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ nwere ike i na-eresi ndi ọchịehi ahịhịa ha ji azụ ehi ha mana ọbụghị inye ha ala ebe ha-ga abịa biri.

Ụlọikpe agbawala Patience Jonathan aka

Patience Jonathan Nigeria former first lady.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Patience Jonathan bụ nwunye onye chibụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan

Ụlọikpe ukwu dị na steeti Legọs enyela iwu ka gọọmentị Naịjirịa weghara ego niile nke EFCC sị na Patience Jonathan zupuru oge di ya bụ Goodluck Jonathan bụ onyeisiala.

Ọkaikpe Mojisola Olaterogun nyere iwu a taa wee kwuo na Patience enyeghi nkọwa zuru oke etu o si nweta ego ndị ahụ.

Akụkọ si mba ofesi

Protesters break into the government headquarters in Hong Kong. Photo: 1 July 2019

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharị iwe na mba Hong Kong

Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Hong Kong abanyela n'ụlọ ndi omeiwu obodo ahụ.

Ha na-egosi iwe ha maka iwu ọhụrụ nke kwuru na e nwere ike ikpụrụ ndị dara iwu obodo ga kpee ha ikpe na china.

N'egwuregwu

Onye nlekọta ndị otu Super Eagles Gernot Rohr na ọgbaa bọọlụ Samuel Chukwueze

Ebe foto si, Twitter/Super Eagles

Nkọwa foto, Onye nlekọta ndị otu Super Eagles Gernot Rohr na ọgbaa bọọlụ Samuel Chukwueze

Onye nlekọta ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ndị otu ya ga-ebili n'ura dịka Madagasaka merichara ha n'ụbọchị Sọnde.

Ka ọ dị ugbua, amabeghi ndị Super Eagles ga-ezute na agba nke ọzọ nke AFCON 2019.

Akụkọ ga-amasị gị:

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Etu nwoke akpọrọ "Nigeria's Supercop" ji ebuso ndị ntọ na ndi ojieegbe ezu ohi agha na Naịjirịa.