Ngozi Chukwuani, nwaanyị di ya tụrụ ịga n'ụkwụ ekwuola ihe butere nsogbu a

Ebe foto si, Grace Chime
Ngozi Chukwuani bụ nwaanyị foto ebe di ya tụrụ ya ịga n'ụkwụ fesasịrị na soshal midia akọwaala ihe buterela ntaramahụhụ ahụ.
Ngozi kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde bụ 23 nke ọnwa Julaị 2020, ka esemokwu butere ịtụ ya ịga a malitere, dịka Uchenna di ya boro ya ebubo na ọ bụ ya kpọrọ ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ ike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ka ha bịa kpụrụ enyi ya nwaanyị ya na ya na-ayị kemgbe.
Mana Ngozi gọrọ ụkwụ na aka ya sị na ọ maghị maka nwụchi a nwụchiri ya, nke ahụ adabaghị ebe Uchenna nọ, nke bụ na o tigidere ya ihe o kubie ume.
Dịka o si kwuo, Uchenna gwara ya sị na ebe enyi ya nwaanyị nọ na mkpọrọ, na ọ gaghị arahụ ụra.
Ọ gbapụrụ ọsọ, gaa n'ụlọ nwanne ya nwaanyị, mana ọ na-amịbata bịa siere ụmụ ya nri. N'ụbọchị ụka ọ bịara ka o sie nri ka o jideziri ya, tie ya ihe ma tụọ ya ịga n'ụkwụ.
Ụmụ ya nụrụ mkpu ya, kpọọ ndị agbataobi bịara gbakaa ụzọ ma kpọọ ndị uweojii kpọtazịrị ndị bịara kwọjie ịga ahụ.

Ebe foto si, Grace Chime
"Ngozi, Uchenna na ọyị ya nwaanyị"
Ngozi kwuru na ọ ma ọyị nwaanyị Uchenna ahụ, ma kwuo na e nweela mgbe ọ gakwuru ya jụọ ya ihe jikọrọ ya na di ya, ọ sị ya na ọ bụ "azụmahịa, enyi nakwa ọlụlụ".
O kwuru na nke nwaanyị gwara ya na ọ ma ya nakwa ụmụ ya anọ niile, mana ọ hụrụ di Ngozi n'anya mere o jiri kweta ịyị ya, na o teela ihe jikọrọ ha abụọ, nke mere na ọ dịghị Ngozi n'aka ikwu ihe ga-ejikọ ya na Uchenna.
Ngozi na onwe ya kwuru na enwere mgbe ya na ụmụ ya so gaa lụso nwaanyị ahụ ọgụ, merụọ ya ahụ, mana nwaanyị ahụ jụrụ ịkwụsị iso Uchenna, mere Ngozi ji lepụzịara ha anya.
"Esemokwu anyị ebidoghi taa"
O kwuru na kemgbe ha ji lụọ, ya bụ Ngozi anọrubeghi otu ọnwa ma di ya etighi ya ihe.
Ngozi gwara BBC Igbo na nsogbu ya na di ya bụ Uchenna ebidoghi taa, na ọ malitere mgbe ha gbachara akwụkwọ n'afọ 2004, mgbe ihe ezinaụlọ ya ji duo ya di abụghị ihe di ya tụwara anya.
O kwuru na Uchenna nọ na-atụ anya na a ga-enye ha ụgbọala, mana ọ bụ naanị ebe obibi e mezichara emezi ka ezinaụlọ Ngozi nyere ha.
Nke a kpasuru ya ezigbo iwe, mana ọ gbagwojuru Ngozi na ezinaụlọ ya anya n'ihi na enweghi mgbe ha jiri kwe ya nkwa ibunye ha ụgbọala.
Ngozi kwuru na ọ bụ ihụnanya mere o jiri lụọ ya, mana kemgbe ahụ ha lụrụ ka di na nwunye ruo ugbua, na ha na-esi n'otu nsogbu fere n'ọzọ.
Ngozi dị afọ 45 bụ onye nkuzi, ebe Uchenna erubeghi afọ 40 enweghi ihe a ga-atụ aka bụ ọrụ ọ na-arụ, dịka nwunye ya si kwuo.
Ebe okwu kwụ ugbua
Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ ebe okwu a mere, gwara BBC Igbo n'ekwentị na a ka na-achọ Uchenna gbapụrụ ọsọ tupu ha erute.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









