Redflags in Relationship: Gbawa ka ụkwụ gị ha ma ị hụ akparamagwa ndị a n'onye chọrọ ịlụ gị

Ebe foto si, Chip Somodevilla
Onye mmadụ lụrụ nwere ike ịme ka o nwee ogologo ndụ maọbụ nwụọ n'oge ya erughị eru dịka ndị okenye si ekwu.
Na nso nso a, akụkọ gbasara mmekpa ahụ nke ezinụlọ gụnyere di na nwunye malitere wuwe na soshal midia nke bụ kwa izu ụka, kwa akụkọ butere ọnwụ tụmadị ụmụnwaanyị nọ na di.
Naanị n'otu ọnwa April 2022, ka a nụrụla akụkọ maka nakwa ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ ọgụ egwu ụka ama ama, a na-atụ di ya aka na o gburu ya.
Tupu ndị mmadụ amalite ịyị onwe ha maọbụ kwuwe okwu ịbanye alụmdi na nwunye, ọtụtụ na-enwe mkparịtaụka banyere ihe dị iche iche gụnyere:
- Ego
- Ịhụnanya
- Ọdịnịhu
Ihe atọ a dị mkpa, mana ọ bụ ya na-eme ka mmadụ mara ma ọ ga-alụ ma ọ gaghị alụ?
BBC Igbo jụrụ Obioma Ogakwu bụ ọkachamara n'ihe gbasara nwoke na nwaanyị, kedụ ụdị akparamagwa ị ga-ahụ ma gbaara onye gị na ya na-ekwu okwu alụm di na nwunye ajọ ọsọ?
Ogakwu kwuru sị: "Ọ bụghị ihe niile bụ maka ego, gịnị ka ị gaghị anabata dịka mmadụ ị bụ?"
"Onye ọbụla nwere ihe na-eju ha afọ ha agaghị anabata ma onye ọzọ mee ha. Iji maa atụ, ọ bụrụ na ihe ị na-achọ n'onye ị chọrọ ịlụ bụ ezi akparamagwa, ya bụ na ọ bụghị onye ji ego ga-ebutere gị ụzọ."

Lee akparamagwa ndị ọzọ Ogakwu kwuru kwesịrị ịchụ gị ọsọ:
- Umengwụ: O kwuru sị na onye ọbụla kwesịrị ị na-agbara onwe ya mbọ, nwee akaọrụ tupu ọ banye na mmekọrịta nwoke na nwaanyị.
"Kedụ etu onye ahụ si eme maka ihe gbasara anamachọọrụ ma ọ bụrụ onye na-enweghi ọrụ?"
- Enweghị nchekwube: Onye ahụ enwere ezigbo olileanya maka ebe ọ chọrọ ịhụ onwe ya n'ọdịnịihu? Ọ na-agba mbọ ịhụ na nchekwube o nwere maka onwe ya bịara na mmezu?
"Ọ bụghị iwu na onye ahụ ga-enwe ego oge ụnụ zutere, mana ọ bụrụ onye na-agba mbọ ma nwee ezigbo nchekwube na atụmatụ, ọ gaghị ebu gị aka makana ọ ga-agbalị hụ na ihe na-aga nke ọma."
- Ezinaụlọ onye si: Kedụ ezinaụlọ onye ahụ si?
"Ụfọdụ ndị si n'ezinaụlọ ebe ọ bụ nne ha na-akpa nri karịa nna, nwereike iwere ya na ọ bụ nwaanyị ha na-alụ ga na-akpa nri dịka ọ dị mgbe ha na-eto."
"Ya mere na ị ga-agbado anya tụlee ma ezinaụlọ ya ọ dị etu ahụ, ma ụmụnne ya a na-akpa ụdịrị agwa ahụ ka ọ bụ naanị ya nwere nsogbu ahụ."
"Kedụ etu o si anabata enyemaka gị? Iwe ọ na-ewe ya na ọ bụ gị na-eweta enyemaka ka ọ bụ ihe ọṅụ nye ya?"
- Ụdịrị enyi o nwere: Kedụ etu ndị enyi ya si eme? Ha a na-eme ọfụma ka ha abụ ndị achịkọta ekwe ọnụ?
E nwere enyi ya nke ị nwereike igakwuru ka ụnụ abụọ kpaa etu ụnụ ga-esi nyere ya aka?
"Ọ bụrụ na ọ naghị anabata enyemaka, ọ baghị uru na i tinyere isi n'ịyị ya bụ ọyị".

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị kpalitere okwu a?
N'abali Epreelụ 8, 2022 ka akụkọ ọnwụ Osinachi Nwachukwu bụ oti egwu ụka ama ama bidoro wuwe na soshal midia.
Ndị ma Osinachi malitere kwuwe na ọ bụ oke mmekpa ahụ di ya na-emekpa ya kpatara ọnwụ ya.
Ndị uweojii mechara gaa nwụchie di ya bụ Peter Nwachukwu ma na-eme nnyocha ka ha mara ma aka ya adị n'ọnwụ nwunye dịka ụwa si ebo ya.
N'otu ọnwa Epreelụ a, ka akụkọ maka etu otu nwoke akpọrọ Ben Ogudoro wuru na soshal midia, a na-ebo Ogudoro ebubo na ọ mụnyere nwunye ya bụ Chinyere Ogudoro na otu nwanne ya nwoke ọkụ mgbe ha na-arahụ ụra.
E nwekwaala akụkọ ebe nwaanyị gburu di ya n'oge gara aga.
Mana akụkọ a azaala otu ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ ihe ndị ị ga-ahụ wee mara na ezi agaghị na alụm di na nwunye ahụ ị na-akwado.
Ihe so kpalite okwu a bụkwa otu nwaokorobịa kọrọ etu nwaanyị ọ na-achọ ihu ya siri wụọ ya n'ala n'ihi na o jighi ụdịrị ego ọ chọrọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'aka ọzọ, otu nwaada kọrọ akụkọ etu daada ya si kwụọ ụdọ ka ọ na-eche ka nwoke ọ lụrụ oge o nweghị ego mechara gbanwee ka ha lụchara ma bido ezinaụlọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ajụjụ ọtụtụ ndị wee bụrụzịa "kedụ nke e mere meta ndị mmadụ?"
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










