Mamman Daura: Okwu ya maka 'zoning' abụghị uche onyeisiala Buhari- Garba Shehu

Mamman Daura na Buhari

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Mamman Daura sị na ya na Buhari bụ ahụghị-ma-erighị n'agbanyeghi na (ha abụghị ọgbọ) ọ bụ nwanne nna ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na okwu Mamman Daura bụ nwa nwanne onyeisiala kwuru maka 'zoning' abụghị uche onyeisiala.

Shehu kwuru sị na ihe Daura kwuru na ọchịchị Naịjirịa kwesịrị ịbụzị onye tozuru etozu karịa na mpaghara etu ọ bụbu, bụ uche Daura.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọ bụ ka ha chịchara ogologo oge ka Daura na-elota 'competence'? - Nnia Nwodo

Nnia Nwodo, Mamman Daura na Okechukwu Obioha

Ebe foto si, BBC/Mamman Daura/Okechukwu Obioha

Ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akatọọla nwa nwanne Onyeisi Muhammadu Buhari bụ Mamman Daura maka ikwu na agaghị eme ntuliaka onyeisiala n'afọ 2020 na mpaghara o rutere nke Bekee kpọrọ 'zoning.'

Ha kwuru na okwu ya nwere ike ibute ọgbaghara ma kposaa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naijiria.

Daura nọrọ na mkparịtaụka ya na BBC Hausa nwere kwuo na ọ bụghị mpaghara onye si ga-ekwu onye ga-eweghara ọkwa onye ga-achị Naijiria na ntuliaka 2023 kama ọ bụ onye tozuru etozu.

Okwu Mamman Daura nwere ike ikposa ọchịchị onyekwuocheya na Naijiria- Nwodo

Mana onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo kwuru na "ọ bụ ka ndị si otu mpaghara Naijiria nọcharala ogologo oge n'ọkwa onyeisiala, ka o chetara na e kwesiri inwe ogogo" onye tozuru etozu ịzọ ọkwa.

Nnia Nwodo

Nwodo sịrị na okwu ahụ Daura kwuru megidere iwu Naijiria dịka ọ dị n' Akụkụ 14(3) nke Iwu 1999 nke kwuru na gọọmenti etiti kwesiri ka a chịkọta ya n'ụdị na mpaghara ọbụla ga-esonye na ya nke Bekee kpọrọ "Federal Character," iji kwado ịdịkọnotu.

Nwodo onye gbara ama na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ 'AIT' were n'abali Wenezde sị, "Ana m akwanyere Mamman Daura ugwu mana okwu ya gosiri na ọ maghị ihe na-aga n'ọchịchị Naijiria, nke ọ na-akwanyere Onyeisiala onye ya na ya bụ otu ọbara ugwu n'ikwu ụdị okwu a nke nwere ike ikposa Naijiria. Ọ bụ ihe mwute."

Nwodo, onye tụrụ arịrị maka oke a na-awọ ndị Igbo na Naijiria siri na "ịchọ onye kachasị tozue etozuo na mpaghara a kachasị megbuo n'ala Naijiria nke bụ Ọwụwa-Anyanwụ" bụ ihe e kwesịrị ime na 2023.

O kwuru na mpahara Ọwụwa -Anyanwụ nwere ebu , nwee mfụ na ndị tozuru ịchị Naijiria.

'Mpaghara ndị ọzọ chịchara, o rue oge o ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ, ọ bụrụ na ọ gaghị abụzi na mpaghara na mpaghara?'

Aha onyonyo, "Ọ gaghị abụ oge o ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ, a sị na ọ gaghị abụzi 'zoning'"

N'otu aka ahụ, Okechukwu C Obioha bụ onye nchịkọta otu 'Southeast for President 2023' bụ SEFORP2023 n'aha ịchafụ kwuru na okwu Mamman Daura kwuru goziri na " ọ chọkwaghị ọganihu Naijiria."

" Onye ahụ na-ekwu ụdị okwu ahụ, ọ nọghị na Naijiria. Ọ ga-abụ ugbua mpaghara ndị ọzọ chịchara, o rue oge o ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ ọ bụrụ na ọ gaghị abụzi na mpaghara na mpaghara?"

Obioha jụrụ ajụjụ sị, ọ bụrụ na ọ bụghị na mpaghara, na mpaghara, gịnị mere ndị mpaghara Ugwu ji sie ọnwụ na Goodluck Jonathan agaghị abịa nke agba nke abụọ ya?

Ọ gara n'ihu kwuo sị, "Okwu ya gosiri na ọ bụghị onye ihe na-aga n'a Naijiria doro anya."

"E were m ya na ọ bụ na o si n'ụra tete. Onye ọbụla kwuru ụdị ihe, ikuku Covid-19 ji ya."

Ọchịchị 2023 ga-abụ maka onye tozuru etozu ọ bụghị 'zoning' - Mamman Daura

Mamman Daura

Ebe foto si, Mamman Daura

Nwa nwanne Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Mamman Daura ekwuola na ịzọ ọchịchị ọkwa onyeisiala na 2023 agaghị agbado ụkwụ na mpaghara onye si nke Bekee kpọrọ 'zoning' kama ọ ga-abụ ihe onye nwenwuru ike ime.

Daura kwuru nke a mkparitaụka ya na BBC Hausa nwere na nsonso a dịka ụfọdụ ndị si mpaghara Ọwụwanyanwụ na-ekwu na ọkwa ahụ kwesịrị irute ndị si mpaghara ahụ.

N'ọsịsa ajụjụ a jụrụ ya maka ihe o chere maka ikenye ọzụzụ onyeisiala afọ 2023, nye otu mpaghara ohere ka ha zọọ, ọ sị: " Eee, ọ bụ ihe dịrị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ịchọ onye kachasị mma. Anyị anwaleela ike ọchịchị na mpaghara na mpaghara, mana ọ mịtaghị mkpụrụ."

"Ihe dị oke mkpa bụ na ọ bụ onye kachasị tozuo ma nwekwa ihe achorọ karịa ebe onye si. Oge eruola oge anyị mekọrịtara mara na anyị niile bu otu."

Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-ahụta Daura dịka otu onye n'ime ndị Buhari ji ọnụmmiri okwu ha eme ihe, nke Bekee kpọrọ 'Cabal' dịka Abba Kyari na Isa Funtua.

Mana oge a jụrụ ya ma ọ na-enye Buhari ndụmodụ, Mamman sị "Ana m aga ekele ya ma nye ya ndụmọdụ ma ọ jụọ m, mana anaghị m etinye ọnụ n'ihe agbasaghị m n'ihi na ọ bụghị etu gọọmentị si eme."

Mamman Daura na Buhari

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Mamman Daura sị na ya na Buhari bụ ahụghị-ma-erighị n'agbanyeghi na (ha abụghị ọgbọ) ọ bụ nwanne nna ya

Daura, onye kwuru na ya na Buhari tokọrọ ma bụrụ ezi enyi n'agbanyeghị na Buhari bụ nwanne nna ya sị "Nna m tọrọ Buhari dịka Buhari bụ ọdụdụ nwa nnanna m."

N'okwu mmekọrịta ya na Abba Kyari nakwa Malam Isa Funtua ndị nwụrụ na nsonso, Daura sịrị na "Ndị ezigbo enyi abụọ akwaala m. Ihe ukwu mere m site n'ọnwụ ha. Ha abụọ bụ ndị ezigbo mmadụ".

Che aka ghọrọ mkparịataụka BBC na Mamman Daura ahụ n'uju ụbọchị Satọde na-abịa.

Akụko ndị ga-amasị gị: