Ohaneze Ndigbo: Ọ bụ eziokwu na otu ọzo ekewapụla onwe ha n'Ọhaneze?
Dịka akụkọ na-ekwu na e nwere otu ọzọ sị n'otu Ohaneze pụta.
Otu n'ime ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ohaneze bụ okaịwu Emejulu Okpalaku tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
Nke a bidoro mgbe mmadụ asaa gara na ngalaba na-ahụ maka ịdebanye ụlọọrụ na otu bụ Corporate Affairs Commisiion were debanye aha otu nke ha kpọrọ Ọhaneze Ndị Igbo General Assembly.
Nke a butere kepukepu na e nwere nsogbu n'Ohaneze nke kpatara otu a ji kewapụ onwe ha.
Kama okaiwu bụ Emejulu Okpalukwu kọwara ihe butere ya bụ nghọtahie.
Ọ kọwara na-e nwere ọtụtụ ngalaba na otu ọzo no n'ime Ọhaneze.
Ọ kọwakwara na idebanye otu a na nke ngalaba CAC bụ ka ha nwee ike rụọ ọrụ ha nke ọma.
Okpalaku kwuru si "ọ bụ ndị na-achọghi ọ dị mma ndi Igbo na-ebu akụkọ a".

