Isa Funtua: Onye bụdị nwoke a Nnamdi Kanu na-ekwu maka ya?

Kanu na Funtua

Ebe foto si, Getty Images/Buhari Sallau

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwara ezigbo arịrị ka o nwetara ozi na ọyị ya nwoke bụ Isa Funtua nwụrụ site n'obi nkoropu.

Mana ozi onye ọzọ dịka onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu zitere maka ọnwụ nwoke a gbara ụwa gharịị.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

A ga-eli Funtua taa bụ ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Julai.

Bute oche ka ị mata onye Funtua bụ tupu ọ nwụọ.

Isa Funtua bụ otu n'ime ndị okenye a kpọrọ (elder statesman) ndị Naịjirịa ji eme ọnụ dịka ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Buhari si depụta na Twitter ya.

  • A mụrụ Funtua n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Jenụwarị n'afọ 1942
  • Ọ bụbu minista na-ahụ maka nhazi mmiri n'okpuruochịchị onyeisiala Shehu Shagari n'afọ 1983
  • Ọ bụ onye ntaakụkọ nwere ụlọọrụ mgbaza ozi
  • O so n'otu e hibere n'afọ 1994-1995 ka ha lebaa anya n'akwụkwọ iwu Naijiria ma hazigharịa ya
  • O so na ndị bu ụzọ gụọ na 'Federal Training Centre, Kaduna'
  • Ọ natara ọzụzụ na mahadum Ahmadu Bello nakwa nke Manchester dị na mba Briten
  • Ọ bụkwa onye azụmahia n'ihe gbasara ngwaọrụ e ji arụpụta ụlọ
  • Funtua bụ onyeisi mbụ nke ụlọọrụ 'New Africa Holdings'
  • Ọ chịrị dịka onyeisi 'Newspaper Proprietors Association of Nigeria, NPAN'
  • Ọ rụrụ dịka onyeisioche 'United Nigeria Textiles (UNTL)'

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya n'elu soshal midia

Ben Murray Bruce bụbu sinatọ Naijiria, kwuru na ya na Funtua kpara nkata n'elekere atọ tupu e zitere ya ozi ọnwụ ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisioche na-ahụ maka ọnọdụ ụmụ Naịjirịa nọ na mba ofesi kwuru na ọ gaghị echefu ndụmọdụ amamihe Funtua na-enyekarị.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị: