Big Brother Naija 2020: Lee ihe ị kwesịrị ịma maka mmadụ 20 nọ n'ime ụlọ a

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ndị Igbo karịrị dịka a malitere Big Brother Naija Season 5 n'ụbọchị 19 nke ọnwa Julaị.

Ozoemena "Ozo" Chukwu

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Ozoemena "Ozo" Chukwu dị afọ 27 bụ onye Imo steeti. Ihe ọ kachasị rite bụ ịrụrụ ngalaba na-achịkọta otu bọọlụ na Yurop bụ Uefa ọrụ na mba ofesi. Ịkọwa maka egwuregwu, ile ejije nkọwa ihe nakwa ihe nkiri ndị ọzọ na-amasị ya. O nwekwara akwa nke o ji aka ya emepụta.
Ngozi "Erica" Nlewedim

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Ngozi "Erica" Nlewedim dị afọ 26 bụ ome ejije. Ọ gụrụ maka ime ejije n'ụlọakwụkwọ a kpọrọ Met Film School dị na Lọndọn. Ọ ga-amasị ya ịbụ ome ejije a ma ama. Ọ na-amasị ya ịṅụ mmanya ma na-agba egwu n'ihu enyo.
Nelson Enwerem Prince

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Nelson Enwerem Prince dị afọ 24 bụ onye Abịa steeti. Ọ bụ "Nwoke kacha mma na Naịjiria" ugbua, dịka o meriri nke a kpọrọ "Mr Nigeria" na Bekee. Ọ bụkwa onye achụmntaego ma anya ekike nakwa, imezi ime ụlọ. Ọ bụ ọkparaeze n'ihi na nna ya bụ eze obodo ya. Igwu mmiri, iri nri nakwa ịgụ akwụkwọ/akụkọ mgbe gboo maka Afrịka nakwa ofufe na-amasị ya.
Florence Wathoni Anyansi

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Florence Wathoni Anyansi dị afọ 29. Nne ya bụ onye mba Kenya ebe nna ya bụ onye Igbo. O nwekwara otu nwa nwoke. Ọ bụ onye achụmntaego na-eji ekike akpa ego. Egwu na-amasịkwa ya. Ọ na-asụkwa asụsụ Swahili.
Tochukwu Okechukwu 'Tochi'

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Tochukwu 'Tochi' Okechukwu dị afọ 28 bụ onye Imo steeti. Ọ bụ otiegwu nakwa onye na-ere ụlọ na ala. Ihe gbasara ịkpa obi aṅụrị na-amasị ya. O kwuru na ọ na-adịtụkwa umengwụ ụfọdụ oge.
Praise Nelson

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Praise Nelson bụ ọgbaegwu si Enugwu steeti. O meriri n'asọmpi ndị na-agba egwu a kpọrọ "K-Pop World Festival", e mere na mba Saụt Koriya n'afọ 2015. Ọ gbakwara onye nke atọ n'asọmpi ndị ọgba egwu na Naịjiria n'afọ 2010. Ọ bụkwa ọkpụ ụzọ na-azụ ndị mmadụ na mmegharị ahụ.
Terseer Kiddwaya

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Terseer Kiddwaya dị afọ 27 bụ onye Benue Steeti. O kwuru na ọ bụ onye onwe ya juru afọ nakwa onye ọkụ na-anụ n'obi. Ọ mara mma ma marakwa nke a. Ime njem na-amasị ya.
Dorathy Bachor

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Dorathy Bachor dị afọ 24 bụ onye achụmntaego. O si Delta steeti. O bu n'obi imenye ndị mmadụ obi aṅụrị. Ihe ọ kachasị rite bụ ụlọọrụ o hibere nke na-ahụ maka ịzụpụtara ndị mmadụ ngwaọrụ.
Eric Akhigbe

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Eric Akhigbe dị afọ 24 bụ onye Edo steeti na-aga mahadum na University of Lagos. Ọ bụ ọkpụ ụzụ ịgbatị ahụ na-amasị. O tokwara ezigbo ogologo. O kwuru na ihere na-emekarị ya. Inwe mmeri n'asọmpi na-akpalite mmụọ ya.
Kate 'Ka3na' Jones

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Kate 'Ka3na' Jones dị afọ 26 bụ onye achụmntaego si Rivas steeti. Ọ na-ahụta onwe ya dịka nwaanyị kajara akaja. Olileanya ya bụ ịbụ onye a ma ama, ma bụrụkwa onye nwere ebe a na-emepụta akwa dị oke ọnụ na mbaụwa. Ebumnobi ya bụ irite ego a mgbe oge zuru n'ihi na ọ kpọrọ ụbịam asị.
Emuobonuvie 'Neo' Akpofure

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Emuobonuvie 'Neo' Akpofure dị afọ 26 bụ onye Delta steeti. Ọ bụ ọkwọụgbọala. Ihe gbasara mmegharị na mgbatị ahụ na-amasị ya. Ọ bụ akpa egwuregwu, ịhụnanya juru ya n'ahụ, o kwuru na ọ na-enwere ndị mmadụ ndidi mana ọ na-abụ agụ ma a bịa n'ihe ịkpa oke nakwa imegbu mmadụ. Ikwusa ihe gbasara ya maọbụ ịkọsa nke mmadụ kọọrọ ya amasịghị ya. Ihe ọ kachasị rite n'ụwa ya bụ N500,000 o ritere n'otu asọmpi ọ gara.
Nengi Rebecca Hampson

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Rebecca 'Nengi' Hampson dị afọ 22 bụ onye achụmntaego. O si Bayelsa steeti. O so n'ụmụnwaanyị ise ikpeazụ a họpụtara mgbe e mere asọmpi nwaanyị kacha maa mma na Naịjirịa (MBGN) n'afọ 2017. Ịmụta ihe ọhụrụ, ime njem, ebe dị ọcha na egwuregwu na-enye obi aṅụrị na-amasị ya. Ụdịrị nwoke masịrị ya bụ nke abụghị "aka gọm".
Timmy 'Trikytee' Sinclair

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Timmy 'Trikytee' Sinclair dị afọ 35 si Bayelsa steeti. Ọ bụ onye na-eji ejije na egwu akọ akụkọ nakwa ekwuputa ebumnuche ya. Ọ sị na ọ dị ka ụsụ - na ọ bụghị anụ elu nke o ji abụ onye ala, na e nweghi ebe ọ kwụ akwụ n'ọha. Nri na-amasịkwa ya.
Boluwatife 'Lilo' Aderogba

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Boluwatife 'Lilo' Aderogba dị afọ 23 bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara ụdịrị nri onye kwesịrị iri. O si Legọs steeti. Ọ bụkwa onye achụmntaego. Ihe ọ kachasị rite bụ ibido ihe nke aka ya. Ọ sị na "Amara Chineke zuru ya ahụ".
Aisha 'Kaisha' Umaru

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Aisha 'Kaisha' Umaru bụ onye achụmntaego dị afọ 25. Nna ya bụ onye Sokoto steeti ebe nne ya bụ onye Igbo. Ọ sị na nri na-edozi ahụ, ịgụ egwu na ịpụ ọrịrị na-amasị ya. Ọ na-atụkwa egwu Chineke.
Lucy Essien

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Lucy Essien dị afọ 30 bụ onye achụmntaego si steeti Krọs Riva. Ọ sị na ọ naghị achọ okwu mana onye akpala ya bụ nwa agụ aka n'ọdụ, makana ọ ga-egosi onye ahụ ihe o ji bụrụ agụ. O kwuru na o kwenyere n'akụkọ ifo. Ezigbo nri na-amasịkwa ya.
Olamilekan 'Laycon' Agbeleshe

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Olamilekan 'Laycon' Agbeleshe dị afọ 26 si Legọs. Ọ bụ otiegwu nwere olileanya iji ọgbakọ a kwalite aka ọrụ ya. Ọ gụrụ ihe Bekee na-akpọ "Philosophy" na mahadum. Ọ bụ otu onye ụfodụ ndị mmadụ lelịrị anya mgba ọ banyere n'ime ụlọ, mana ha gbanwere ebumnuche ha ozugbo ha hụrụ na o nwekwara ọgụgụ isi. Ịkpa nkata maka aramara na-amasị ya. Ihe ọ kachasị rite bụ egwu ya a kpọrọ "Fierce" nke ndị MTV Base kpọrọ ọnwa isii n'agba egwu iri a kacha achọ.
Tolani 'Tolanibaj' Shobajo

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Tolani 'Tolanibaj' Shobajo dị afọ 27 bụ otu onye ihe gbasara ịkpa obi aṅụrị doro anya. Ọ bụ "ọbata o su" ma ya na ndị mmadụ gbakọọ ịkpa obi aṅụrị. Ịgba egwu na isi nri masịrị ya nke ukwu. Tolanibaj sị na ọ bụ maka ịmabute ego a ka o ji bịa n'ihi na ọ hụrụ ego n'anya. Ọ sịkwa na ihe gbasara Naira Marley masịkwara ya.
Ezekiel Bright Osemudiame 'Brighto'

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Ezekiel Bright 'Brighto' Osemudiame dị afọ 29 bụ onye ọrụụgbọmmiri si Edo steeti. Ọ gụrụ 'Marine Engineering' na mahadum Arab Academy for Science Technology and Maritime Transport dị na mba Ijipt. O kwuru na ihe gbasara ịkpa obi aṅụrị na-amasị ya. Ihe ọ kachasị rite na ndụ ya bụ inweta ohere ịga mahadum na mba na-abụghị Naịjiria n'efu.
Victoria "Vee" Adeyele

Ebe foto si, Big Brother Naija/Africa Magic

Nkọwa foto, Victoria "Vee" Adeyele bụ nwaada dị afọ 23 na-eti egwu. A mụrụ ya na Lọndọn mana ọ kwaghachịtara Legọs otu afọ gara aga ka o nwee ike itinye uchu n'egwu ọ na-agụ. O kwuru na ihe na-aka amasị ya bụ ime ejije, nakwa ya na ndị mmadụ inwe mmekọrịta nakwa ịkpa ndị mmadụ ọchị. O kwuru na ọ yịtụbeghi nwoke karịa ọnwa isii. O kwuru na ihe ọ kachasị rite na ndụ ya bụ ịgụ egwu n'emume a kpọrọ Palmwine Music Festival n'afọ gara aga.