Izu Madubueze: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu okorọbịa a

Ebe foto si, Izuchukwu Madubueze/Linkedin
Akụkọ na-ewu ọkụ ugbua bụ akụkọ pụtara gbasara otu okorọbịa echere na o gburu onwe ya maka ebubo ụgha.
Dịka ọ dị ugbua, akụkọ si na nke mbụ pụta bụ na ọ bụ n'ihi ebubo mwakpo ụgha ka o ji were ndụ ya.
Ndị enyi ya bu iwe n'obi were depụta akụkọ a na-ekwu na oge eruola a ga-achọ ihe e mere onye ọbụla boro mmadụ ebubo mwakpo ụgha.
Ha malitere #JusticeforIzu iji kwupụta na ekwesiri inye Izuchukwu ikpe ziri ezi ma n'ọnwụ.
Ugwunna Ejikem kwuru na a ga na-eme ndị boro ndị mmadụ ebubo mwakpo ụgha, otu ihe a na-eme ndị mere mmadụ mwakpo
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Zaddy Clinton na-ekwu na nwaanyị ọbụla boro mmadụ ebubo mwakpo ụgha kwesịrị ị ga ụlọ mkpọrọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Isheunife na-ekwu na ọ bụ naanị n'ihi na ọ jụrụ nwaanyị ahụ ọyị ka o ji boo ya ebubo a were ndụ ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Otu onye ma Izuchukwu achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC n'ozi ekwentị na nke a mere n'ezie nakwa na o na-ewute ha nke ukwu.
O kwukwara na ọ bụ na mba Amerịka ebe nwa okorọbịa ahụ bi ka akụkọ a mere.
Iwu mba Amerịka nyere ohere ka onye ọbụla eboro ebubo ụgha kpụpụ onye boro ya ebubo ahụ ụlọikpe.