Kanye West ejirila anya mmiri zọpụ njem ịzọ oche onyeisiala Amerịka

Ebe foto si, Reuters
Kanye West bụ onye a ma ama n'iti egwu malitere ịchụnta vootu ya maka ntuliaka onyeisiala mba Amerịka nke afọ 2020 n'obodo Charleston dị na South Carolina.
West dị afọ iri anọ na atọ (43) na-azọ ọkwa a na nke onwe ya n'aha pati ọ kpọrọ "Birthday Party".
N'emume ahụ, oti egwu a mere mkpebi banyere iwu ma kwuo ọtụtụ okwu banyere ite ime nakwa onye mkpochapụ ire ohu bụ Harriet Tubman.
Kedụ ihe Kanye West kwuru n'ọgbakọ achụnta vootu ahụ?
Ite ime ga-abụ ihe iwu kwadoro
Kanye West kwenyere na ite ime kwesịrị ịbụ ihe iwu kwadoro n'Amerịka, ma sị na e kwesịrị ịkwado nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'ụzọ ego - tụnye arọ na " onye ọbụla nwere nwa ga-enwete otu nde dọla".
"Otu ihe ga-enye anyị nwereonwe bụ naanị irube isi n'iwu ndị e nyere anyị maka alaeze e kwere na nkwa," O kwuru. "Ite ime kwesịrị ịbụ ihe iwu kwadoro ị ma maka ihe ọ bụ? Iwu a esighi na Chineke, ya mere kedụ ihe mere ya iwu?"

Ebe foto si, Reuters
O nwere mgbe ọ malitere ibe akwa dịka ọ na-ekwu maka ite ime, sị na ọ fọrọ obere ihe ka nne na nna ya tee ime ya: "A karịghị inwe onye dịka Kanye West, maka na nna m enweghi ohere."
O kwukwara: "Egbuchaala m nwa m nwaanyị...ọ bụrụgodi na nwunye m [Kim Kardashian] ga-agba m alụkwaghị m n'ihi okwu a, ọ bụ ya webatara North n'ime ụwa, mgbe m na-achọghị ya.
Onweghi mgbe e kpochapụrụ ire ohu
N'oge ọzọ, o nyere nkọwa uche ya banyere onye kpochapụrụ ire ohu n'agba afọ narị iri na itoolu bụ Harriet Tubman.
"Harriet Tubman ekpochapụghị ohu n'ezie, ihe o mere bụ ị sị ndị ohu ahụ gaa rụọrọ ndị ọcha ọzọ ọrụ," o kwuru.

Ebe foto si, Getty Images
A mụrụ Tubman n'ohu mana o jisiri ike gbapụ site n'ugbo dị na Maryland n'afọ 1849, mgbe ọ dị afọ 27. Ya lọghachị na mpaghara Saụt ịzọpụta ndị ohu ọzọ n'ụlọ ohu a kpọrọ "underground railroad", tinye ndụ ya nihe izendụ iji nye ndị ọzọ nwereonwe.
West bekwara akwa mgbe ọ na-ekwu maka nne ya nwụrụ n'afọ 2007 na nsogbu pụtara mgbe ọ na-awa ahụ.
Kanye West onwere ohere ịpụ n'ikpe vooru nke steetị?
West, bụ onye kwupụtara uche ya ịzọ ọkwa n'ụbọchị 4 ọnwa Julaị, enweteghi ohere itozuoke ịzọ ọkwa n'ọtụtụ steetị. O kweịrị inwete ọtụtụ nkwado ga-ezu ka aha pụta n'igbe vootu steetị ndị ọzọ.
N'izuụka gara aga, o tozuru oke isonye na ntuliaka onyeisiala n'Oklahoma, bụ steetị mbụ o tozuruoke tupu ohere emechie.
Iji tozuoke na nke South Carolina, o kwesịrị inwete nkwado site n'aka mmadụ ruru puku iri (10,000) n'elekere 18:00 BST n'ụbọchị Mọnde.










