Imo State: Enweghị mgbe Uzodinma ji mee m Emir - Onyeisi ndị Alakụba Imo steeti

Ebe foto si, Suleiman Yusuf Njoku
Onyeisi ndị alakụba n'Imo steeti bụ Suleiman Yusuf Njoku ekwuola na onweghị mgbe gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma ji mee ya Emir na steeti ahụ.
Suleiman kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ehihie Fraịde.
Akụkọ wuru ewu n'oge gara aga na Uzodinma ehibela Emir na Imo steeti, mana Suleiman kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.
Suleiman kwukwara na e nwere ọgbakọ ndị alakụba na steeti dị iche iche n'ala Igbo.
O kwuru na nna ya mụrụ ya na ụmụnne ya n'ụsọrọ Islam, ya agụọ akwụkwọ ndị bekee gụkwaa nke alakụba.
Ọ rịọrọ ka ndị mmadụ ghara ị na-ahụ ndị Islam niile dịka ndị ogbu ara ọbara makana a bịa n'otu ọbụla a ga-enwe ndị ọma na ndị ọjọ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Gbasara okwu Biafra, Suleiman kwuru na Biafra ga adịrị ala Igbo mma ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe Chukwu kwadoro.
Ọ kọwara na ihe niile dị Chineke n'aka n'ihi na ọ bụ ihe o kwuru ga-eme.
Gbasara ndị ụka alakụba na-amalite oge Ramadan ha, bụ oge ha ji ebu ọnụ na-ekpe ekpere, Suleiman rịọrọ ndị ụka Islam n'ala Igbo ka ha hụ mmadụ ibe ha n'anya ma na-enyere ndị onweghị ka ọ ha ha aka.
O kwukwara na ọbụghị eziokwu na Islam kwenyere na onye gburu mmadụ n'ihi okwukwe ya ga-aga eligwe.








