Coronavirus Have Your Say: Anyị ga-ahụ na ego mba ụwa kere ga-eruteriri ala Igbo - Kọmịshọna ahụike Enugu

Ebe foto si, Twitter/Bayo Omoboriowo
Kọmishọna ahụike n'Enugwu steeti bụ Ikechukwu Obi ekwuola na ha agaghị ekwe ka ego ndị mba ụwa nyere Naịjirịa iji nye aka maka ọrịa coronavirus ghara irute ala Igbo aka.
Dọkịta Obi kwuru na gọọmentị ga-agbalị ike ya niile ịhụ na ndị mmadụ atagbughị onwe ha n'ahụhụ n'oge a akpọchiri ebe niile.
Na mkparịtaụka ahụ, Obi kọwakwara na gọọmentị na-agbaso atụmatụ mgbochi ọrịa karịa ịgwọ ya agwọ.
O kwuru nke a oge otu onye jụrụ ya ma gọọmenti ọ ga-agbaso atụmatụ Bekee kpọrọ 'herd immunity' iji mara ma a ga-emeri ọrịa ọjọọ a bụ covid-19
'Herd immunity' bụ atụmatụ ịhapụ ka ọrịa fee ọtụtụ ndị mmadụ iji mee ka ihe na-ebuso nje agha n'ahụ mmadụ bụ 'immunity' gbalie ma busowe ya bụ ọrịa agha.
Obi kọwara na 'herd immunity' agaghị arụ ọrụ maka coronavirus n'ihi na ya bụ ọrịa na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ.
Lee mkparịtaụka anyị na ha ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Etu Anambra si gwọta onye nwere coronavirus n'Anambra steeti
Anyị mere ihe niile WHO nyere ka usoro e ji agwọta ndị bu nje coronavirus.
Kọmishọna ahụ ike n'Anambra steeti bụ Vincent Okpala ekwuola na ngalaba ahụike steeti ahụ sonyere atụmaatụ niile Nigeria Center For Disease Control wepụtara eji a gwọ nje coronavirus.
Lee mkparịtaụka nke nke anyị na Kọmịshọna Anambra steeti, Dr. Vincent Okpala na-akpa maka etu ha siri gwọta onye nwere nje maka Coronavirus.
Dr. Okpala jikwara ohere a bugharịa na 'Isolation center', wee gosi BBC Igbo ebe ha na-ebuba ndị mmadụ.
Kirie ya ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2














