Covid-19 Outbreak: ‘Dike’ isii pụtara n'oge coronavirus a

Ebe foto si, REUTERS/ADENE'S FARM FLOWERS
Akụkọ a bụ maka mmadụ isii n'ime ha, nwereike ikpalite mmụọ gị.
1)Isi n'uwe e ji achọ mma fee n'uwe ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, Fashion House
Nwaagbọghọ onye dụọdụọ e jiri uwe eji achọ mma mara, esila na ya bụ njirimara ha banye n'ịdụ uwe ndị ọrụ ahụike na mba Libya.
Nke a ha na-eme bụ ọrụ akwụ ụgwọ ụmụagbọghọ ndị ahụ ji enyere aka n'oge ugbua, nke ne-emecha ka ha na-arahụ n'ọrụ mgbe ụfọdụ.
Ha akwapụtala ụwe ndị ọrụ ahụike iri ise kemgbe ha malitere, ma banye n'ịkwapụta ọtụtụ ọzọ.

Ebe foto si, FASHION HOUSE
Ndị ọrụ ahụike Tripoli Hospital jara ha ike maka ọrụ ha.
Najwa Taher Shokriy bụ onye nwe ya bụ ụlọọrụ, gwara BBC na ya bụ atụmatụ malitere mgbe otu dọkịnta nke ụlọọgwụ al-Jalaa Hospital nke dị na Tripoli rịọrọ ndị achụmntaego enyemaka.
Shokriy bụ onye malitere ịkwa uwe otu afọ gara aga, sị na ọ bụghị ụkpa ekele a na-enye ya ugbua dị ya mkpa, kama na ọ bụ inyere aka maka ibuso coronavirus agha.
O kwuru na obi ya dị n'ịkwapụtakwu ọtụtụ uwe ndị ọrụ ahụike, mana enweghị ngwaọrụ na-echere ha aka mgba.
2)Ụlọ onye na-akụ flawa:

Ebe foto si, ADENE'S FARM FLOWERS
Ọrịa coronavirus emeela ka a kagbuo ọtụtụ agbamakwụkwọ nke mere na ahia flawa anaghị agazị.
Mana ụfọdụ ndị ọrụ ha bụ ikụ nakwa ire flawa n'obodo Paarl, Saụt Afrịka gbakọtara ime ka ya bụ ụsụahịa bụrụ uru.
Nke a mere ndị ọrụ Adene Farm jiri were flawa ha chọọ Huis Vergenoegd Old Age Home bụ ebe ndị kara nka na-ebi, mma.

Ebe foto si, ADENE'S FARM FLOWERS
Ndị okenye bị n'ụlọ ahụ nọ n'ime ụlọ maka ọrịa coronavirus, mana a hapụrụ ha ka ha pụta gbaara anya ha ekeresimesi n'Epreelụ.
Ndị mmadụ na-agafe jakwara ha ike.
3) Otu onye nwe ụlọ sị ndị bi n'ụlọ ya akwụla ụgwọ ụlọ
Onye nwe ụlọ nke Bekee kpọro 'landlord' sị mmadụ iri atọ na anọ bi n'ụlọ ya akwụla ụgwọ ụlọ n'ọnwa Maachị na Epreelụ n'ihi etu coronavirus si metụta achụmntaego.
Michael Munene nwere ọnụụlọ iri abụọ na anọ ebe a na-akwụ ya dọla 30 kwa ọnwa na mba Kenya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
4)Nwaada na-eji afọ agba egwu ji ya eme ndị mmadụ obi ụt

Ebe foto si, Reuters
Nermine Sfar bụ ote egwu mba Tunisia sị na ya na-ete egwu n'ihe onyonyo iji mee ndị mmadụ obi ụtọ dịka ha nọ n'ime ụlọ ha maka ọrịa coronavirus.
Ọ na-ezipu egwu ya ngwa ngwa dịka ọ na-agba ya n'ịntanetị, nke nde kwuru nde mmadụ na-ekiri dịka ha nọ n'ụlọ ha ugbua.
Ọ malitere ịgba egwu a tupu e tie iwu mmachibido ndị mmadụ ịpụta ezi n'ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị.

Ebe foto si, Reuters
5)Ọgụegwụ enyela ụlọ ya dịka ebe a ga na-elekọta ndị butere ọrịa coronavirus

Ọgụegwu mba Itiopia bụ Hamelmal Abate enyela ụlọ ya ka e were ya mere ebe a ga-edowe ndị nwere nje coronavirus.
N'ọnwa Maachị, gọọmentị mba Itiopia gwara ndị ọbụla si njem ofesi bata mba ahụ na ha ga-anọ n'ụlọndina ihe ruru izuụka abụọ, bụ nke ha ga-akwụ ụgwọ ya ruo mgbe ha ga-anọcha mmachibido maka
nnyocha (quarantine) ha.
Abate bụ onye aka ya chawara n'ịgụ egwu kemgbe 1990, gwara onyentaakụkọ BBC bụ Kalkidan Yibeltal na ya bụ atụmatụ dị mma maka ndị ji ego ga-emeli ihe dị n'ime ya.

6)Ọchee goolu kwụrụ ndị mmadụ ụgwọ nr

Ebe foto si, LMC Media
Ochee goolu ndị Plateau United bụ Chinedu Anozie, nyere mmadụ atọ ego nri ka ha were nwee ike ịnọ n'ụlọ n'oge coronavirus a.
Chinedu nyere ndị nkwado ya mmadụ atọ puku naịra ise ka ha were 'kụwa abụ' dịka ha nọ n'ụlọ ugbua.










