President Muhammadu Buhari: Ihe iri gbara ọkpụrụkpụ Onyeisiala Muhammadụ Buhari kwuru maka Coronavirus

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka mba ụwa na-aluso Coronavirus ọgụ, gee ihe iri gbara ọkpụrụkpụ Buharị gwara ndị Naijirịa.

Nke mbụ bụ na:

1) Buhari kwuru sị na site na ndụmọdụ Ministri ahuike na Nigeria Centre for Disease Control (NCDC), ka o ji nye iwu ka amachie ngagharị na Legọs, Abuja na Ogun steeti site n'elekere iri na otu nke abali Mọnde ụbọchị iri ato nke ọnwa Maachi.

Mmachi a ga-eru izuụka abụo na mbido.

O kwukwara ka ndi bị na steeti ndị a nọrọ n'ụlo ha ebe ụlọọrụ niile dị na ebe ndị ahụ ga-emechi n'oge a.

Ọ kowara na mmachi a ga-enyere aka ịchọpụta ndị bu ya bụ ọrịa coronavirus ma nye kwa ha ọgwụ maka ọgwụgwọ.

Kama ọ sị na ụloorụ ndị a gunyere :

  • Ndị na-emepụta nri
  • Ndị na-ere mmanụ ụgbọala
  • Ndị na-ekesa ọku latrik
  • Ụlọorụ ndị nchekwa ndị mmadụ nwe.

Na-agbanyeghị nke a, a ga-enyocha ma ha ekwesiri imepe.

O kwukwara na ndị ụlọọrụ mgbasa ozi, ntaakụko, ndị na-emepụta akwụkwọ ozi, na ndị ọzọ yiri ha ga-arụ ọru ma ha gosipụta na ha agaghị enwe ike isi n'ụlo arụ ọrụ ha.

Aha onyonyo, Coronavirus amaghị onye dị ọcha maọbụ ojii.

2) Ihe ọzọ okwukwara bụ na ọdọ ụgbọmmiri dị na Legos ga-arụ ọru ma sịkwa na ụgboala gwongworo na-ebu nrị na ihe ndị ọzọ dị mkpa mmadụ ji ebi ga-aga n'okporoụzọ.

3) Nke abụọ bu na gọọmenti ewepụtala ijeri naira iri na ise maka ọgụ imeri coronavirus.

4) Ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpu o kwuru bụ na ego niile gọomentị binyere ndị mmadụ site na-atụmatụ TraderMoni,MarketMoni na FarmMoni ya na ego ebinyere site n'aka Bank of Industry, Bank Of Agriculture na Nigeria Export and Import Bank agaghị enwe ego ọmụrụnwa n'ime ọnwa atọ na-abịa.

O kwukwara ka ụlọọrụ ndị ọzọ na-ebinye ego wepụta atụmatụ ka ndị ha binyere ego ghara ịta ahụhu maka mmachị a.

5) Nke anọ bụ na agaghị enwe mfepụ maobu mfebata ụgbọelu ọbụla n'ime izuụka abụọ a.

6) Ọzọ bụ na gọọmentị ga-enyere ndị niile mmachi a metụtara na Legọs nakwa Abuja aka site na inye ha nkwado iji nyere ha aka.

7) Atụmatụ inye ụmụakwukwọ nri ga-aga n'ihu dịka minista na-ahu maka ọdịmma mmadụ na gọomenti steeti ga-ewepụta atụmatụ inye ụmuakwụkwo nri nke na-agaghị etinye ha na nsogbu ibute coronavirus.

8) Buhari kwukwara na ndi enweghị etu oha ha ga-enweta ego nkwado ọnwa abụo nke a ga-akwụ ozugbo ma ndi nọ kwa na ogige gbatagbata ga-enwete kwa nrị ọnwa abụọ n'ime izuụka ndị na-abịa.

9) Ndị niile chọrọ inye aka ga-eme otu a site na kọmiti nke onyeisiala wepụtara nke akpọrọ Presidential Task Force.

10) Muhammadu Buhari kwukwara na ọgụ a bụ ọgu ọnwụ na ndụ, nke mere na ihe kacha gọọmentị mkpa bụ nchekwa ndụ ndị Naijirịa na nchekwa ụzo ha sị akpata ego.

Onyeisiala kwuru ihe ndị a na mgbe a na NTA.

Leekwa akara ya ebe:

Skip YouTube post
Hapụ Google YouTube ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of YouTube post

Lee ihe nkiri a

Aha onyonyo, Coronavirus: Akụkọ ọma i kwesịrị ịnụ gbasara ọrịa a

Akụkọ ga-amasị gị