Coronavirus: Ihe ga-akpọwanye nkụ n'izu na-abịa

Ahịa nri
    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Ndị ọkammụta agbaala afa na ọ bụ ezie na obodo bụ igwe otu izu akpọchichere ebe niile maka ọrịa coronavirus mana ihe ka ga-akawanye njọ n'izu na-abịa.

Ọkanchọcha azụmahịa, Kachi Ononuju kwuru na nke a ka bụ ụtụtụ na-ebe ihe isiike dị.

Ọ gwara ndị mmadụ kee aji n'ume na nke ukwu ka kpe azụ.

Kachi sị na ọ bụrụ na aga emela coronavirus na Naịjirịa, na ihe ka mma bụ ikpọchi ebe niile ruo ihe dịka izuụka abụọ.

coronavirus

O kwuru na nke ahụ pụtara na ihe ga-esiwanye ike, mana nke ka njọ ga-eme ma ọbụrụ na-emeghị otu ahụ.

Ọtụtụ mmadụ amalitelarị iti mkpụ maka ọnụahịa nri n'ahịa n'otu izuụka akpochiri ebe niile na Naịjirịa maka ọrịa coronavirus.

Nke a mere BBC Igbo ji lebe anya ịchọpụta ka ahịa nri si tinyecha ego na steeti ụfọdụ n'Alaigbo nakwa na Legọs.

Abakaliki

N'Abakaliki, Ebonyi steeti, ihe anyị chọpụtara na ihe nri e si ebe ọzọ bubata na steeti ahụ tinyechara ego mana ihe nri ana emepụta na ebe ahụ dị otu ọ dị.

Dịka Ngozi Nwobia bụ onye gara ahịa taa bụ Fraịde si kwuo, ihe dịka mkpuru azụọkpọọ tinyere ego site na narị naịra abụọ na iri ise (N250) ruo na narị naịra atọ na iri ise (N350).

Nke pụtara na ọ tụkwasara otu narị naịra n'elu ọnụahịa ya.

Azụọkpọọ

Ebe foto si, Ngozi Nwobia

Nkọwa foto, Otu mkpuru azụ a bụzị N350 na Abakaliki ugbua

Ọ kwuru na Ịsha ana ere otu narị naịra (N100) bụzị narị naịra ise (N500) ugbua.

Tomatosu mkpụrụ na onwe ya sizi narị naịra atọ (N300 ) ruo narị naịra ise (N500).

Enugwu

Nwaada Tonyi Jimoh bụ onye na-ere ahịa n'Enugwu sị na ọtụtụ ihe nri tinyere ego.

Akpa osikapa Bekee si puku narị naịra iri abụọ na otu (N21,000.00) ruo puku narị naịra iri abụọ na ise.

Nkata tomatosu mkpọ sị na puku naịra ise (N5000) ruo puku naịra asaa na nari ise (N7500).

Tomatosu

Ebe foto si, Getty Images

Katọnụ Spageti si puku atọ na narị asaa na iri ise (N3750) ruo puku atọ na narị asatọ na iri ise (N3850).

Otu tin garị si narị anọ (N400) ruo narị asaa (N700).

Otu akpa Semo si puku atọ na narị isii (N3600) ruo puku atọ na narị asatọ (N3800).

Legọs

nri

Nwaagboghọ na-esi nri ahịa na Legọs bụ Agatha John-Pat sị na ụfọdụ ihe nri rikwara na legọs ebe ndị ụfọdụ nọkwa ebe ha nọbụ.

Penta egwusi sị otu puku naịra na narị asaa (N1700) ruo otu puku na narị asatọ (N1800).

Penta garị sizi narị naịra asaa (N700) ruo narị naịra itoolu (N900).

Akpa Semo obere ka nọ ebe ọ nọ na otu puku naịra na ụma asaa (N1700).

Yabasị na onwe ya ka nọkwa na narị naịra abụọ (N200) mana ha kpopuru ya ihe na mkpụrụ ole ọ na-adịbu.

coronavirus branding

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Uru na ọghọm dị na mmadụ isi n'ụlọ arụ ọrụ