Football Gossip: Mbappe a na-achọ ụzọ ọpụpụ na PSG?

Kylian Mbappe

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 13

Kylian Mbappe na-agbara mba Fransị nakwa otu PSG bọolụ ahaziewela ọdịnihu ya n'egwuregwu bọọlụ a.

Akụkọ pụtara na-akọwa na ọchọrọ ka-etinye ohere n'ime akụkwọ ọrụ ya ga-ekwe ya hapụ PSG gaa otu Real Madrid maọbụ otu Yurop ọbụla masịrị ya n'ọdịnihu.

Amabeghi ma anya otu Real Madrid ma otu ọbụla a dị n'ebe Mbappe dị afọ 21 nọ.

Gịnị bụ ọdịnịhu Neymar n'egwuregwu bọọlụ

Neymar

Ebe foto si, Reuters

Kepu kepu na-efegharị na-ekwu na anya Neymar dị n'ebe otu Barcelona nọ.

Neymar da Silva Santos bụ ọgba bọọlụ a ma ama na-atụ anya ịlaghachi n'otu bọọlụ Barcelona nke mba Spen.

Ugbua, ọ na-agbara otu PSG nke mba Fransị bọọlụ mana o nwereike ịchabi ụgwọ ọrụ ya n'ọkara ma o kpebie ịga Barcelona.

N'otu aka ahụ Mesut Ozil ọgba bọọlụ mba Jamini ga-anọzi na afọ ọhụrụ otu ọhụrụ dịka otu Fenerbahce na otu ya bụ Arsenal na-ahazi akwụkwọ a ga-eji zụ ya n'afọ bọọlụ ọzọ na-abịa.

Otu Tottenham na-ana otu Newcastle nde pounds iri na abụọ na ọma ise maọbụrụ na ha chọrọ ịkpọpụta Mauricio Pochettinho dịka onye nchịkọta ha n'ọnwa Mee a.

Ihe ịtụ anya dị na ya bụ na ọnwa Mee gacha, Tottenham nwereike ịkpọrọ Pochettinho n'efu.

Ọzọ, otu Real Madrid adịla nkwadobe ịkpọpụta ego ole ha chọrọ ịzụ Paul Pogba nke Fransị na Manchester United ka ọ bịa sonye ha.

Otu Liverpool, Intermilan, Juventus, Chelsea nakwa Arsenal so na otu ndị hiri asaa n'anya achọ ndị ọgba bọọlụ ọhụrụ ha ga-azụta.

A ga-egbubi ego Neymar na-eri ma ọ bụrụ na ọ ga-alaghachi Barcelona

Neymar

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Neymar

Kepu kepu si n'ọgbọ egwuregwu apụta na-akọwa na Neymar ga-anara ụgwọọnwa e wepụrụ ihe ruru nde paụnd 26 ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịlaghachị Barcelona.

O teela akụkọ na-efegharị na Neymar dị afọ 28 ugbua chọrọ isi Paris Saint Germain (PSG) pụọ ma laghachi ebe ọ gbaburu mbu.

Cheta na Neymar gbaara Barcelona bọọlụ site n'afọ 2013 ruo afọ 2017 tupu o si ebe ahụ gafee PSG.

James Rodriguez ọ ga-agafe MLS?

James Rodrigues

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, James Rodrigues

Akụkọ na-efegharị na-akọwa na David Beckham bụ onye nwe otu egwuregwu Inter Miami dị na MLS na mba Amerịka na-atụ alo etu ọ ga-esi zụta James Rodriguez.

Akụkọ ahụ kwuru na Beckham bụbu ọgbabọọlụ na onwe ya, na ndị Real Madrid bụ ebe Rodriguez na-agba, akpaala maka ịzụrụ ya.

Mara na kemgbe ka kepu kepu na-apụta maka etu Rodriguez dị afọ 28 nwereike iji si na Madrid pụọ na ngwụcha afọ a.

Premier League a ga-ebido ole mgbe?

Odion Ighalo na Juan Mata

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onwebeghi onye ma mgbe asọmpi 'English Premier League' ga-amalite ọzọ

Akụkọ na-akọwa na ụfọdụ ndị klọb agwala ndị ọgbabọọlụ kee nkwụcha n'ihi na ha nwereike imalite izukọ maka nkwado ịbịaghachị ọrụ.

Ha na-atụ anya imalite ya bụ mbido nkwado n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee nke afọ 2020 a.

Manchester City a ga-azụ Aubameyang?

Pierre-Emerick Aubameyang

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akụkọ kwubukwara na Pierre-Emerick Aubameyang nwere ike ịga Real Madrid

Kepu kepu si n'ụwa egwuregwu apụta na-akọwa na Manchester City esonyela n'otu egwuregwu ndị chọrọ ka Pierre-Emerick Aubameyang nke Arsenal gbaara ha bọọlụ.

Akụkọ a kwukwara na Barcelona, Inter Milan na Real Madrid chọkwara ịzụrụ nwaamadi a dị afọ 30.

Mara na ihe jikọrọ ya na Arsenal, ya bụ nkwekọrịta dị n'etiti ha abụọ, ga-agwụ n'afọ 2021.

Manchester United achọghịzị Rodriguez

James Rodrigues

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, James Rodrigues

Kepu kepu ọzọkwa na-eru anyị ntị na-akọwa na Ike agwụla Manchester United ịchụgharị James Rodriguez.

Rodriguez dị afọ 28 na-agbara Real Madrid bọọlụ ugbua.

Nkwekọrịta dị n'etiti ya na Real Madrid ga-akwụsị n'afọ 2021.

Mana akụkọ na-ekwu na ọ bụ ndị Arsenal na Rodriguez ka okwu nwere ike ịdabara.

Onye ka Mourinho bu n'uche ịzụ?

Jose Mourinho

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jose Mourinho

Akụkọ pụtara na-akọwa na Jose Mourinho bụ onye nchịkọta otu Tottenham na-atụ anya ịzụta Raul Jimenez dị afọ 28.

Jimenez bụ onye mba Meziko na-agbara Wolverhampton bọọlụ.

Ọ bụ otu onye Mourinho na-enwe olileanya iji anọchị anya Harry Kane ma ọ bụrụ na kepu kepu na ọ ga-apụ bịa na mmezu.

Juventus chọrọ ịzụ Kane dịka Real Madrid chọrọ ire Bale

Harry Kane

Ebe foto si, Press Association

Nkọwa foto, Harry Kane nwere ike ị hapụ Tottenham

Dịka akụkọ ahụ si kwuo, etu Kane dị afọ 26 si agba bọọlụ na-amasị Juventus, "ọ kabeghi nka, ọ bụ ezigbo onye ndu, ya na Cristiano Ronaldo nọkọọ ọ ga-adaba ọfụma".

N'otu aka ahụ, Christian Vieri gbabuuru mba Itali bọọlụ kwukwara na ọ ma na ịgba bọọlụ na mba Itali ga-adị Kane mma n'ahụ.

Harry Kane

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Harry Kane na-aṅụrị maka mmeri goolu na asọmpị

Vieri kwuru sị na ọ ma na "La Liga maọbụ Serie A ga-adịrị Kane mma ma ọ bụrụ na ọ chọọ isi Tottenham apụ".

Madrid na-achọ ire Bale

Gareth Bale na-egosi onwe ya

Ebe foto si, EPA

Akụkọ si mba Spen apụta na-akowa na Real Madrid na-achọ ire ndị egwu ha gụnyere Gareth Bale, James Rodriguez, Lucas Vazquez na Mariano Diaz.

N'agbanyeghi na Bale dị afọ 30 achọghị akụkọ a na-ekwu na ọ dịka ọ gaghị enweta ohere ịnọ.

Mara na ọ dị ka Rodriguez dị afọ 28 na-achọ ịpụ, n'ihi na onye na-asụrụ ya ụzọ bụ Jorge Mendes ji tọọchị na-agba ọkụ ịhụ ndị ọ na-agụ agụụ ịzụta ya.

Giroud ọ ga-ahapụ Chelsea?

Olivier Giroud

Ebe foto si, Reuters

Akụkọ na-efegharịkwa na Olivier Giroud na-agbara Chelsea bọọlụ ga-efere ha aka mgbe asọmpi bọọlụ malitere ọzọ.

Akụkọ ahụ kwuru na Giroud dị afọ 33 na otu egwuregwu Inter Milan ekwekọrịtala na ọ ga-agbara ha bọọlụ mgbe nkwekọrịta ya na Chelsea ga-agwụ n'afọ a.

O kwukwara na ya na Inter Milan bụ ebe Antonio Conte chịkọtaburu Chelsea na-achịkọta ugbua, na-achọ inwe nkwekọrịta ga-eme ka ọ gbaara ha afọ abụọ ma nwekwaa ike ịtụkwasị ya nke atọ ma ọ chọọ.

Marakwa na akụkọ pụtara na mbido ọnwa a na Chelsea na-achọ ịdọtikwu nkwekọrịta ha na Giroud nwere, ka o nwee ike nọtukwuo opekatampe otu afọ ọzọ.

Pierre-Emerick Aubameyang

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nkwekọrịta Pierre-Emerick Aubameyang na ndị Arsenal ga-akwụsị n'afọ 2021

N'asịrị gbakaa ute egwuregwu nke taa, Ọ dịka Real Madrid ana arọ Pierre-Emerick Aubameyang nke Arsenal anya, dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo.

Aka nchawa Aubameyang pụtara ihe kemgbe o sị Borussia Dortmund banye Arsenal n'ọnwa Jenụwari afọ 2018.

Mana ugbua, aha ya bụzi onyemaechi maka na nkwekọrịta ya na ndị Arsenal ga-ebi n'afọ ọzọ.

Ka ọ dị ugbua, Madrid ekwubeghị uche ha gbasara ya bụ nwaamadị gbara afọ iri atọ, mana ya bụ eziokwu ga-apụta ihe mgbe adịghị anya maka na ha chọrọ onye ọkpa ya dị nkọ ka nke Aubameyang.

Ọnwa Camavinga ọ chakeela?

Eduardo Camavinga

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eduardo Camavinga

Ugo Eduardo Camavinga, nwaafọ mba Kongo, nke na-agbara otu egwu bọọlụ Rennes nke mba Frans achakewala o.

Camavinga malitere ịgbara ndị Rennes kamgbe ọ dị afọ iri na ise

Onye nkuzi ndi Rennes bụ Julien Stephen kwuru na n'ezie ya bụ nwaadị chị ọkụ n'ọkpa nke bụ na ọnwere ike ịgbanwuru ndị Real Madrid, "mana ọ fọrọ nwa jaị ka ugo ya chakechaa. Ya nwetukwuo ndidi ihe dịka otu afọ".

Ọtụtụ otu egwu bọọlụ nwere agba dịka Real Madrid amalitelarị ịrọ ya bụ nwa amadi na-agba etiti anya maka ịzụrụ ya.

Onye nkuzi ya ugbua bụ Stephen sị na Camavinga etoruola ihe eji dimkpa eme n'egwu bọọlụ.

Sadio Mane ọ ga-erita nturuugo Ballon d'Or na-abịanụ?

Sadio Mane

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E nyere Sadio Mane asambodo dịka otu n'ime ndị kacha agba bọọlụ n'ụwa n'afo 2019

Sadio Mane turu ọnụ na mba ya bụ Senegal na ya ga-ebutelata nturuugo Ballon d'Or nye ha n'aka.

Nke a mere ka ndị mmadụ malite ikwu otu ya bụ echiche nwere ike iji puta ihe.

Ụfọdụ na-ekwu na ihe ga-eme ka ya bụ nturuugo ruo Mane aka bụ na ọ ga-esi na Liverpool gaa Barcelona maọbụ Real Madrid.

Gịnị mere ha ji eche otu a?

Sadio Mane na Lionel Messi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sadio Mane na ndị Liverpool napụrụ Messi na ndị Barcelona ọnụ n'ara n'asọmpi 'Champions League' nke 2019

Echiche ha gbadoro ụkwụ na Messi na Ronaldo ritere ya bụ nturuugo na mbụ na-agba na Spen.

Ya bụ, ha na-eche na ịgbara Barcelona maọbụ Real Madrid ga-enye Mane ezigbo ohere irite ya bụ nturuugo.

Mana, John Aldridge bụbu ọgbaa bọọlụ ndị Liverpool na-akọwa na Mane nwere ohere na Liverpool ịnweta ya bụ nturuugo karịa ebe ọzọ.

Dịka Aldridge kwuru, nke mbụ bụ na ọ tụọ ọkpa na Barcelona, ya na Messi ga-achịpụgodu ya ebe ahụ tupu ọ nwete onwe ya.

Mane, gbara afọ 28 si Southampton bata Liverpool na 2016.

Kamgbe ahụ, o nyela goolu iri 77 n'asọmpi 161.

Liverpool ji ya n'ọrụ rụọ afọ 2023.

Chelsea chọrọ ire Ngolo Kante

Ngolo Kante

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ngolo Kante

Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea dị njikere ire nwaafọ mba France na-agbara ha bọọlụ bụ N'Golo Kante ma ọ bụrụ na e kwee ya ezi ọnụahịa.

Kante di afọ 29 ugbua mana Chelsea echeghi na ohere ka dịịrị ya ịgbara ha bọọlụ n'ọdịnihu dịka ha emepeela ụzọ ịnabata ndị chọrọ ịzụ ya.

Real Madrid na Paris Saint-Germain etinyela uche ha n'ịzụ Kante bụ onye ka nwere ohere ịgbara Chelsea bọọlụ ruo afọ 2023.

Ọtụtụ ndị nkwado Chelsea na-ahụta N'Golo Kante dịka 'ụdọ' na-ekechiri ha ebe etiti ma a bịa n'asọmpi.

Messi agọọla na onweghi ihe jịkọrọ ya na Inter Milan

Lionel Messi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lionel Messi

Nwafọ Ajentina na-agbara Barcelona bọọlụ bụ Lionel Messi agọọla na onweghi ihe jikọtara ya na otu egwuregwu Inter Milan dị n'Itali.

Messi bụ onye dị afọ 32 kwuru nke a n'akara Instagram ya, iji katọọ akụkọ na-efegharị nke sị na ndị Inter Milan chọrọ ịzụ ya.

Ọtụtụ ndị hụrụ egwu bọọlụ n'anya sị na Messi bụ ọkacha agba bọọlụ n'ụwa ebe ndị ọzọ sị na ọ bụ ogbo ya Cristiano Ronaldo.

Countinho na-achọ ịlọghachi na 'Premier League'

Philippe Coutinho

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Philippe Coutinho

Nwafọ mba Brazil na-agbara Barcelona bọọlụ bụ Philippe Countinho na-achọsike ịlọghachị na Premier League.

Dịka ọ dị ugbua Chelsea na Barcelona na-enwe mkparịtaụka n'isi Countinho, ka a mara ma ọ ga-agafe Chelsea.

N'otu aka ahụ obi siri Chelsea ike na ha ga-amabute Countinho n'ụgwọ site n'aka Barcelona bụ onye ha chụwara kamgbe Eden Hazard pụrụ.

Countinho nọ n'aka Bayern ugbua bụ ebe Barcelona zigara na mgbazinye, mana ọ dịka Bayern achọghị ịzụ ya kpam kpam.

Nwaamadị a bụ odogwu oge ọ na-agbara ndị Liverpool, mana kamgbe ọ pụrụ, onwetechabeghi onwe ya nke ọma.

Manchester United na Juventus na-azọ onye ga-azụ James Rodriguez

James Rodrigues

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, James Rodrigues

Man United, Juventus na Napoli so na ndị na-agba mgba onye ga-amabute James Rodriguez site n'aka ndị Real Madrid.

Nwaafọ Kolombia a anaghị eme nke ọma na Real Madrid ugbua kamgbe o si Bayern Munich lọghachịta.

Akụkọ kwuru na Rodriguez nwereike ibelata ego ole a ga-akwụ ya iji mee ka ọ pụọ maka oge ya na Madrid ga-agwụ na 2021.

Coronavirus ga-esi nyere Man United aka ịzụta ndị egwu - Solksjaer

Ole Gunnar Solksjaer

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ole Gunnar Solksjaer, onye nkuzi ndị Manchester United

Onye nchịkọta Manchester United bụ Ole Gunnar Solksjaer sị na obi siri ya ike na ha ga-eji ohere mkpamkpa ọrịa Coronavirus a zụta ndị ọgba bọọlụ dị ha n'obi.

O kwenyere na ụfọdụ otu egwuregwu ga-achọ ikpofu ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ n'ihi ụkọ ego dị ugbua bụ nke ọ sị ga-enyere Man United aka.

Na mkparịtaụka ya na ndị 'Sky Sports', Solsjaer kwuru na "egwu bọọlụ ga-alọghachị n'uju ma ọrịa Covid-19 gaachaa, ma ihe kachasị mkpa bụ na anyị dị njikere mgbe ọ ga-eme".

Ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ Man United na-achọ ịzụ gụnyere; Jadon Sancho nke Borussia Dortmund, Jack Grealish nke Aston Villa na Jude Bellingham.

Real Madrid agbanyụọla ọkụ ịzụ Mbappe n'afọ a maka Coronavirus

Kylian Mbappe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kylian Mbappe

Nrọ ndị Real Madrid na-arọ ịzụta Kylian Mbappe n'aka ndị Paris Saint-Germain ga-echere ruo afọ ọzọ tupu ọ na-abịa na mmezu.

Nsogbu na ụkọ ego dakwasịrị ọtụtụ otu egwuregwu n'ihi Coronavirus mere ha jiri chegharịa echiche n'ịzụ nwamadị a.

Real Madrid malitere atụmatụ ịzụ Mbappe kamgbe afọ ise gara aga mana otu ihe maọbụ nke ọzọ na-ama ha aka n'ihu.

Atọhapụla Ronaldinho na mkpọrọ na Paraguay

Ronaldinho

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ronaldinho nọrọ ụbọchị 33 na mkpọrọ tupu a tọhapụ ya

Ronaldinho, onye ọgba bọọlụ mba Brazil a ma ama, enwerela onwe ya dịka a tọhapụrụ ya n'ụlọ mkpọrọ na Paraguay.

E jidere Ronaldinho na nwanne ya nwoke bụ Roberto Assis n'ọnwa Maachị n'ihi ebubo na ha ji 'passport' adigboroja wee bata n'obodo ahụ.

A kpụpụrụ ha ụlọikpe ma tinye ha na nga ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe ha.

Aha onyonyo, Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ'

Mana n'ụbọchị Wenezde ka ọkaikpe nyere iwu ka atọhapụ ha ka ha nọrọ n'otu ụlọ oriri na nkwari ruo mgbe ikpe ahụ ga-ebi.

Ọkaikpe ahụ nyekwara iwu ka Ronaldinho na nwanne ya kwụọ puku narị dọla asatọ n'otu n'otu.

Aha Ronaldinho na-ada ụda n'ụwa niile n'ihi ihe o ji ụkwụ eme n'egwuregwu bọọlụ.

O ritere nturuugo onye kacha agba bọọlụ n'ụwa niile n'afọ 2004 na 2005.

Ronaldinho sokwa n'otu ndị Brazil buru iko mba ụwa n'afọ 2002.

Messi

Ebe foto si, Getty Images

Kepukepu na-efegharị bụ na Lionel Messi nwereike ịhapụ Barcelona gawa Inter Milan dịka Massimo Moratti bụbu onyeisi Inter Milan si kwuo.

Moratti sị na ọ bụ ihe nwereike ime site na mgbanwe ọnọdụ ego di ugbua n'ihi ọrịa coronavirus bụ nke ga-enyere Inter Milan aka ịzụta Messi.

Messi agbaarala Barcelona boolụ kamgbe ọ malitere ịgba bọọlụ na nwata rute ugbua mana uche Inter Milan adịla n'ebe ọ nọ nke ukwuu.

Ha nwere olileanya na ọzụzụ Juventus zụtara Cristiano Ronaldo site Real Madrid ga-eme ka ịgbalite mmụọ Messi ịbịa Inter Milan.

Manchester United na-achụsị Jadon Sancho ike ka nwa ọkụkọ

Jadon Sancho

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jadon Sancho

Obi siri ndị Manchester United ike na ha ga-azuta nwafọ Ịngland bụ Jadon Sancho site n'aka ndị Borussia Dortmund n'oge orire na ọzụzụ ndị ọgba bọọlụ nke afọ a.

Nwamadị a dọọrọ mkpụrụobi ndị Man United site n'ịgba bọọlụ nke ọma n'otu egwu Borussia Dortmund nke mere ha ji achụsi ya ike.

Akụkọ kwuru na Sancho ekwetela ịgafe n'Old Trafford bụ ọgbọ egwuregwu ndị Manchester United.

N'aka nke ọzọ akụkọ kwukwara na Paul Pogba chọrọ izụ onwe ya nye n'aka ndị Real Madrid.

Barcelona, Real Madrid na Manchester City na-azọ onye ga-azụ Martinez

Martinez

Ebe foto si, Getty Images

Barcelona na-agbasi mbọ ike ịzụ Lautaro Martinez dị afọ 22 site na Inter Milan mana Real Madrid na Manchester City na-echere ha aka mgba.

Na-agbanyeghi nke a Barcelona ka bụ ndị nwere ezigbo ohere ịzụta nwafọ Ajentina a karịa Real Madrid na Man. City.

Akara ntụ-ntụ

Barcelona chọrọ iji Griezman gbanwere Neymar

Messi na Neymar

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Messi ekwuola ugboro ugboro na ọ ga-amasị ya ma Neymar lọghachite na Barcelona

Otu egwuregwu Barcelona ka nwere olileanya ịzụta nwafọ Brazil bụ Neymar site n'aka ndị Paris St-Germain.

Dịka Sky Sports si kwuo, ọ ga-amasị Barcelona iji Antoine Griezmann gbanwere Neymar.

Cheta na Neymar gbabuuru Barcelona bọọlụ tupu ọ hapụ ha gawa PSG n'afọ 2017 n'ọnụ ego ruru nde yuro 222.

Ọ bụ eziokwu na Neymar mere ọfụma oge ọ nọ na Barcelona mana ụfọdụ ndị mmadụ kwenyere na Lionel Messi enyeghi ya ezigbo ohere ka ọ chakee, nke kpatara o ji pụọ.

Barcelona gbalịrị ịzụtaghachi Neymar n'afọ gara aga, mana PSG ekweghị ere ya.

Haaland awụọla Manchester United n'ala

Erling Haaland

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Erling Haaland

Erling Braut Haaland na-agbara Borussia Dortmund bọọlụ awụọla Manchester United n'ala dịka ha chọrọ ịzụrụ ya.

Ọnụ na-ekwuru Haaland bụ Bernie Mandic kwuru na Haaland kwenyere na ọ ga-aka mee nke ọma na Dortmund karịa ịga ebe ọzọ.

Pogba nwere olileanya ịga Real Madrid

Paul Pogba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Paul Pogba

Nwafọ mba France bụ Paul Pogba ka nwere ọnụnụ ọkụ n'obi ịhapụ Manchester United gawa Real Madrid.

Pogba chọrọ ka ya na nwanna ya Zinedine Zidane, bụ onye nchịkọta Real Madrid rụkọọ.

Oke mmerụ ahụ ekwebeghi Pogba zuru ike na Manchester United kamgbe o si Juventus gafee ebe ahụ n'afọ 2016.

Ndị Chaịna ebunyela Ighalo ite ego ka ọ lọghachi

Ighalo Jude

Ebe foto si, @Ighalojude/Twitter

Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Odion Ighalo nọzị n'etiti ịhọọ mmiri maọbụ amụma.

Ọ bụ n'ihi na otu bọọlụ Shanghai Shenhua na mba Chaịna ewelitela ụgwọ izuụka ya rue £400,000.

N'aka nke ọzọ, ọ ka ji otu ụkwụ nọrọ n'otu Man Utd ebe ọ gara dịka onye ọgba bọọlụ e bitere ebite

Ighalo sonyere Shanghai Shenhua n'ọnwa Febụwarị afọ 2019, ebe Man Utd si hụ ya were biri ya mbimbi.

Ighalo na-enwe olileanya na Man Utd ga-azụrụ zi ya dịka onye bọọlụ nke ha zuru oke mana otu Man U ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya.

Ya mere ndị mmadụ na-ajụ "Gịnị ka Ighalo ga-eme?"

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ighalo n'onwe ya ekwuputebeghi ihe ọbụla maka nke mana ka anyị na-ele anya.

Barcelona nwere ike ire Griezman

Antoine Griezmann

Ebe foto si, Getty Images

Ihe abụọ chere otu Barcelona n'ihu ugbua nke gụnyere - ibelata mmefu ego nakwa ikwalite otu bọọlụ ha.

Nke a mere ha ji tinye Antoine Griezmann n'ahịa na "Transfer season" ọzọ na-abịa n'ihi na o meghi ka ha si tụọ anya mgbe ha ji ego yuro nde narị n'ọma abụọ zụta ya n'aka Athletico Madrid.

Mana ha na-akwado ire ya sọọsọ yuro otu nde narị iji nwetakwa ego ha mefuru n'isi ya.

Kepu kepu na-ekwu kwa na otu ndị welitere isi dịka Man United, Chelsea, Arsenal na PSG na-enyo Griezmann enyo maka ịzụta ya.

Ka a na-atụ anya mara nke ga-eme n'ahịa "Transfer" ga-emepe n'oge na-adịghị anya.

Ihe nwereike ime ka Pogba gaa Real Madrid maọbụ Juventus

Paul Pogba

Ebe foto si, paulpogba/Instagram

Akụkọ ndị akwụkwọ mgbasa ozi SUN dere na-akọwa na ha nwereike irepụ Paul Pogba n'ọnụ £100M.

Nke a na abịa dịka ndị otu bọọlụ Real Madrid na Juventus na-achụsị ya bụ nwa okorobia ike.

N'akụko ọzọ ndị otu Manchester united na-ajụ ese ịzụta Philippe Coutinho gbara afọ iri abụọ na asaa n'aka ndi otu Barcelona. (Mundo Deportivo)

philippe Coutinho

Ebe foto si, phil.coutinho/Instagram

Nkọwa foto, Philippe Coutinho na-agbara ndị mba Brazịl bọọlụ

Ndị akwụkwọ mgbasa ozi Goal na-ekwu na ndị otu Athletico Madrid na-akwado ịdọtị nkwekọrịta afọ ọrụ ha na Thomas Patey nwere ka ọ rụo afọ 2025.

Ha ga-ebuli kwa ego isi ya rụo €100M.

Thomas Teye Partey

Ebe foto si, thomaspartey5/Instagram

Nkọwa foto, Partey bụ nwaafọ Ghana

Nke a na-abịa dịka ndị Arsenal na otu Manchester United na-achọ ịzuta ya.

Kepukepu na-ekwu kwa na David Alaba onye na-agbara ndị otu Bayern Munich na-atụli ma ọ ga-esi otu ya pụo dịka ndị otu Real Madrid na Barcelona na-achọ ịzụta ya (Sport Bild-in German)

David Alaba

Ebe foto si, da_27/Instagram

Nkọwa foto, Alaba na-gbara ndị mba Austria bọọlụ

Ndị otu egwu bọọlụ Arsenal eweela iwe dịka ha sịrị na ndị otu Barcelona na-arafụ Pierre-Emerick Aubameyang n'ọrụ ya.

Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na Aubameyang chọrọ ị ga otu Barcelona (Star).

Pierre-Emerick Aubameyang

Ebe foto si, aubameyang97/Instagram

Kama Aubameyang sị na obi dị ya ụtọ n'Arsenal.

Akụkọ na-ekwu kwa na onye nkụzi ndị Arsenal bụ Mikel Arteta chọrọ irepụ Henrikh Mkhitaryan sị mba Armenia dịka ndị otu Roma na-agbalị ka ha zụta ya azụta na abụghị mgbazị(Express)

Henrikh Mkhitaryan

Ebe foto si, micki_taryan/Instagram

Nkọwa foto, Henrikh Mkhitaryan nọ na mgbazị n'otu Roma

Onye nwe otu egwu bọolụ Chelsea bụ Roman Abramovich na-anụ ụda Coronavirus dịka ọ sepụrụ oher pawụnd abụọ na ọma.

Roman Abramovich

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Abramovich gbara afọ iri ise na atọ bụ onye nwe otu Chelsea

Kama Abrahimovich ka bụ kwa ide dịka akụ ya ka karịkwara ijeri pawụnd iri (Star).

Ndị otu Aston Villa na-achụ Dion Sanderson ọsọ ụkwụ eru ala.

Ha chọrọ ka ọ bụrụ onye otu ha kama Sanderson ka na-agbara ndị otu Cardiff City na mgbazị (Football Insider)

Kepukepu na-ekwu kwa na anya ndị Manchester United nọ n'isi Samuel Umtiti.

Samuel Umtiti

Ebe foto si, samumtiti/Instagram

Nkọwa foto, Umtiti na-agbara ndị mba Fransị bọọlụ

Umtiti na-agbara ndị otu Barcelona na ndị mba France( Sport na Spanish).

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Gọvano Sanwo-Olu ejirila nde naira 250 tie ndị ọkụ gaasị metụtara aka n'obi