Odion Ighalo: Onye nzọpụta abịago?

Ebe foto si, Getty Images
Igbo sị na a nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbaa ụfụfụ mana enwekwara ndị na-anyụ karịa ibe ha.
Odion Ighalo nyere aka bulite ọnọdụ ndị Manchester United n'asọmpi ha niile na premiership n'asọmpi ndị ọzọ ha gbara.
Ọtụtụ anabataghị ọzụzụ ndị Man Utd zụrụ Ighalo kama nkata ekpuola ha n'isi dịka Ighal na-egosi na ọ bụ dike n'ịgba bọọlụ.
Lee ihe ndị ikwesiri ị ma mere ka nwoke a ji bụrụ "a kwaa ọ kwụrụ"
Ihe ị kwesiri ịma maka Odion Ighalo?
Ighalo bụ nwaafọ Naijirịa amụrụ n'afọ 1989.
A mụrụ Ighalo n'Ajegunle dị na Legọs steeti.
Ọ na-agba bọọlụ dịka onyee goolu nke ndị Bekee na-akpọ "Striker".
Ighalo bidoro ịgba bọọlụ ya na Naijirịa na otu Prime na Julius Berger.
Ọ bụ otu Shanghaị Shenhua ka ọ sị bia Manchester United na mgbaziri.
Ighalo na-enyere ndị na-enweghị etu ọha ha na Naijirịa aka.
Ọ bụ onye mbụ bụ onye Naijirịa gbarala ndị Man Utd ma nyekwara ha goolu.
Barcelona chọburu ịzụta ya ma okweghị ịga.
Ịbịa Manchester United dịka ịlọta ụlọ n'ihi na ndị ezinaụlọ ya bi n'obodo Manchester.
Ọ bụ ya bụkwa ọnye kachasị nye goolu n'asọmpị iko Afrịka nke afọ 2019.
Ighalo kwụsịkwara ịgbara ndị Naijirịa bọolụ n'afọ 2019.








