Chelsea vs Man United: E reela Chelsea ka ọkpa 9th Mile rie 'change'

Rudiger

Ebe foto si, Getty Images

Na Chelsea nyere goolu abụọ a gụfuru agufu azọnwughi ha n'aka ndị Manchester United riri ha ka ọkpa dị ọkụ n'ụlọ ha.

Goolu abụọ Anthony Martial nyere na nkeji 45 na nke Harry Maguire nyere na nkeji 66 zuru ịgba ha n'akpa ma nye Man Utd mmeri ha chọ bịa Stamford Bridge.

Bido n'isi egwuregwu a ka ndị Man Utd zọwara Chelsea Ojukwu, ọkachasị mgbe e wepụrụ N'golo Kante mere ka ọ na-achaturu ha ọkụ na nkeji iri e ji bido bọọlụ.

E ji mkpebi ihe onyonyo VAR gụfuo goolu abụọ ndị Chelsea gbakanyere, nke mere ka obi daa ndị na-akawado ha ka ebe a wụrụ mmadụ mmiri ọkụ.

E bu ụzọ gụfuo goolu Kourt Zouma dịka VAR gosiri na aka Caesar Azpilicueta kwara Brandon Willliams enyeghị ya ohere ịgbafu bọolụ dịka onye egwu azụ.

Goolu a gụfuru

Ebe foto si, Getty Images

Ebe a gụfuru nke Olivier Giroud na nkeji 76 dịka VAR gosiri na ụkwụ ya gafere ebe ọ na-ekwesịghị.

Ndị mmadụ na-eti mkpu na e kwesịrị ịchụpụ Maguire dịka ọ zọrọ Michy Batshuayi ụkwụ n'amụ, mana VAR nyochara ya sị na e nweghi ihe ọjọo mere.

Odion Ighalo bụ onye ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ dịka Chelsea nabatara Manchester United na Stamford Bridge.

Ndị Naịjirịa kere ajị n'ume na-eche ịma ma nwanna ha ọ ga-aza aha nna ya.

Mgbe e wepụrụ Martial webata ya na nkeji 90, ọ nwara ike ya ịgbakanye goolu, mana isi ya apụtaghị.

Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka ji pọịntị 41 nọrọ n'ọkwa anọ na tebulu Premier League ebe Man Utd ji pọịntị 38 si n'ọkwa itoolu rigoro asaa.

N'egwuregwu ikpeazụ ha gbara tupu nke a, Chelsea na Leicester City ji goolu abụọ abụọ dọọ ka ọkwụrụ, ebe Man Utd na onwe ha gba aka goolu mgbe ha gbara ọnyụpa ka ha na Wolves zutere.

Gịnị gbasara Ighalo?

Odion Ighalo

Ebe foto si, Manchester United

Ighalo bụ onye Naịjiria mbụ ga-agbara Manchester United kemgbe ha kpọrọla ya na mbinye ebe ọ ga-anọ ọnwa isii, so na ndị a kpọpụtara nwereike iso agbaso Chelsea bọọlụ.

Dịka Ole Gunna Solskjaer bụ onye nchịkọta Man Utd na-atụ anya na Ighalo na Bruno Fernandes ha zụrụ ọhụrụ ga-etikọta isi ọnụ gwọọ Chelsea ara.

N'ụbọchị nke 16 nke ọnwa Febrụwarị a, chi fotere ụbọchị asọmpi Man Utd na Chelsea, ka Ole kwuru na Ighalo nwereike ịnọrọzị n'otu ya ma ọ bụrụ na ihe jikọrọ ya na Shanghai Shenhua bie n'afọ a.

Mana kedụ ihe ị che? Odion ọ ga-agbatanwu ihe Man Utd ga-eji kwụzịa ụgwọ isi ya?