Man United vs Burnley FC: A sụọla Manchester United ka ede ụrị na be ha

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Burnley asọghị anya ka ha ji ọkpụ goolu abụọ chara acha zọọ Manchester United aja n'Old Trafford.
Goolu Chris Wood nyere na nkeji 39 e ji bido bọọlụ na nke Jay Rodriguez nyere na nkeji 56 zuru imenye ndị Man Utd n'agbanyeghi na enweghi onye a chụpụrụ achụpụ.
Iwe mmeri a e meriri ha n'azụ ụlọ ha mere ka ndị na-akwado Man Utd malite ịkwa ha emu.
Ha kwogidere ha 'wooo!!' oge ha na-apụ n'ọgbọegwuregwu oge a gara ezumiike nkeji iri na ise a na-aga ma a gbachaa ọkara nke mbụ, ma kwokwaa ha ọzọ ka ha na-apụ mgbe a gbazuru bọọlụ.
Ha burukwara iwe ahụ gbadata na soshal midia ebe ha na-ekwu '#OleOut' nke bụ ịkpọ oku ka a chụpụ Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe bu mbụ Burnley na-emeri Man U n'ime ugboro 15 ha na-ezute. Ọ bụ n'afọ 1962 ka ha meriri Man U. Ọ bụ ọkpụ goolu ise asatara abụọ ka ha gbara n'oge ahụ.
Marcus Rashford bụ onye egwu Man Utd esoghi gbaa bọọlụ n'ihi ahụ ọ merụrụ, nke ahụ gosiri ọfụma maka etu Man Utd si gbagide ọnyụpa n'egwuregwu a.
Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka ji pọịntị isii aga ha, ebe Burnley na onwe ha ji ohere ahụ rigote n'ogogo 13 na tebulu.








