Man United v Aston Villa: Manchester so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ

Anthony Martial

Ebe foto si, AFP/GETTY IMAGES

Ọ dịka ọ bụ otu ekwe na-akụrụ otu Arsenal nakwa ogbo ha ndị Manchester egwu.

Ọ bụ n'ihi etu ha si jiri ọkpụ goolu abụọ gbaa onye laba onye laba mgbe ha zutere otu Aston Villa.

Agba nke mbụ agachaghịrị otu Man Utd ọfụma dịka Grealish nke Aston Villa nyere ọkpụ mbụ na nkeji 11.

Man Utd nwara ịchụkwite ha mana ọ rara ha ahụ rue na ngwucha agba nke mbụ mgbe Heaton pịanyere goolu mbụ ha na nkeji 42.

Lindelof gbanyere ọkpụ Man Utd abụọ na nkeji 64 mana aṅụrị ha anọteghi aka dịka Mings saghachiri ha ọkpụ ọzọ na nkeji 66.

Man Utd malitere ịgba mbọ nakwa ịgbochi Aston Villa ịnye goolu ọzọ mana o nweghi ọkpụ goolu si na ya pụta.

Aston Villa ka ritere otu 'point' n'agbanyeghị na ha gbara onwe ha onye laba onye laba.

Dịka ụfọdụ otu egwu bọọlụ na-achụ ndị nkuzi ha, anya ndị mmadụ dị zị n'ahụ Ole Gunner Solskjaer ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị