Enugu Fuel Crisis: Ihe anyị ji kpọchie ụlọahịa mmanụ ụgbọala n'Enugwu - IPMAN

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala akọwaala ihe ha ji gbaa abụbụ ọrụ n'Enugwu n'ụbọchị Tuzde nke tinyere ọtụtụ ndị mmadụ na gbagharịa.
Onyeisi otu a bụ Chinedu Anyaso kwuru na abụbụ ọrụ ahụ bụ iji mee ka Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi mepeere ha ụlọọrụ a kpọchiri akpọchi.
Anyaso kwuru na kamgbe ha batara n'ọchịchị n'ọnwa Nọvemba 2019, isi ụlọọrụ ha kpọchiri akpọchi.
O kwukwara na ha edeela akwụkwọ degara ndị uweojii, DSS, nakwa ụlọọrụ gọvanọ, mana onweghị onye ṅara ha ntị

Anyaso gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị isi otu IPMAN n'Abuja nyere ha ikike ka ha kpọchịe ụlọahịa 'petrol' niile dị n'Enugwu.
Ha machikwara ụgbọala tanka niile bu 'petrol' ịbata n'Enugwu.
Nke a mere ka Gọvanọ kpọọ ha oku udo, ma mechaa nye iwu ka a kpọghee ụlọọrụ ha.
Boko Haram ga-akwụ ụgwọ ihe ha mere - Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @bashirahmad
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buharị akatọọla ogbugbu Lawan Andimi bụ onyeisi ndị ofufe Kraịst n'obodo Michika dị n'Adamawa Steeti, bụ onye ndị otu oyiegwu gburu, na-agbanyeghị na ha gosipụtara na ha chọbụru ịhapụ ya.
Buahrị kwuru na ọ ga-agbalị na ndị oyi egwu a ga-erite ụgwọ ihe ha mere n'uju ya.
O tiri ndị ofufe kraịst niile na Naijirịa, ndị otu CAN na ndị ezinaụlọ ya aka n'obi ma sị ka ụwa niile tinye aka ka a kwụsị ndị otu oyiegwu a niile.
Ma sịkwa na "Nke a agbaala ha ume dịka ndị gọọmentị na ndị agha Naijirịa imeri ndị otu oyi egwu niile na Naijirịa ma na ọdida anyanwụ Afrịka.
Ọzọkwa

Ebe foto si, Twitter/@FMICNigeria
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ngalaba na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe ntuziaka ka a rụọ ụlọọrụ ji ihe akọpụtara n'ubi arụpụta ngwaahịa na steeti niile dị na Naịjirịa.
Mịnịsta nta na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe bụ Mariam Katagum kwuru nke a ụbọchị Wenezde.
Katagum kwuru na atụmatụ ahụ ga-eme ka akụnụba Naịjirịa bawanye, ma mekwaa ka nri dị n'uju n'obodo
Naijira na Briten

Ebe foto si, Bashir Ahmed/Twitter
Mba Briten na Naijirịa enweela nkwekọrịta itinye ego n'azụmahịa nke ruru otu ijeri naịra na iri ise na atọ na ọma.
Ọ bụ na nzụkọ UK-Africa summit na-eme na Lọndọn ugbua ka ndị oji ego achụ ego nke mba UK na Naijirịa nwere nkwekọrịta a.
N'Ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa si na nje coronavirus nke sitere na China selite isi na-esinwanye ike dịka ndị na-ahu maka ahụike na mba ahụ kwuru na nje ahụ nwere ikike ịmụba onwe ya, nke ga-eme ka ọ gbasaa n'ike.
Ka ọ dị ugbua, ọrịa a egbuola mmadụ itoolu ma gbasaa ruo mba Amerịka,Taịland na Saụt Korịa.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu egwu bọolụ Arsenal sitere ọnwụ wee gbata onye lawa onye Lawa dịka ha zutere Chelsea n'asọmpi Premier League.
N'agbanyeghị na ha dị naanị mmadụ iri agba ndị Chelsea zuru ezu, ha gbalịrị ịhụ na ha abụọ jị goolu abụọ abụọ were laa.
Eniola Aluko
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nwaada Nigeria bụ Eniola Aluko esonyerela ndị otu egwuregwu bọọlụ Aston Villa nke mba England dịka onyeisi nhazi egwuregwu maọbụ 'Sporting Director' na Bekee.
Eniola bụ nwanne Sone Aluko onye gbaara ndị otu 'Super Eagles' nke Naịjirịa n'oge gara aga.
Mana Eniola bụ ụmụnwaanyị mba Ịngland ka ọ nọchitere anya ha oge ọ na-agba bọọlụ.









