Nigerian English: Okwu Nigeria 28 banyere 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020

Oxford English Dictionary

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford English Dictionary' nwere mkpụrụokwu ruru 830,000

Ị ma na ụfọdụ okwu e jiri mara ndị Naijiria abanyela n'akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020?

Okwu ndị a bụ okwu Bekee bụ so onye Naijiria maọbụonye ya na ndị Naijiria mekọrọla ihe nwere ike ịghọta so n'okwu ndị na-ede Oxford Dictictionary gụnyere n'okwu Bekee.

Okwu dịka okada bụ ihe a na-akpọ onye ji ọgbatumtum achụ nta ego;buka maọbụ 'mama put', bụ onye osinri na-anọ ọgbaụzọ nakwa K-leg bụ okwu e ji akọwa onye ụkwụ ya gbara ngọ.

Dịka ozi onyeisi na-elebanye anya uche onye na Oxford Dictionary' bụ Danica Salazar sịkọwaa, site na iwere asụsụ Bekee mee ya nke ha, ndị Naijiria enyela nkwado pụrụ iche nye asụsụ Bekee dịka asụsụ ozuru mba ọnụ.

Lee okwu ndị a hụ banyere Oxford Dictionary n'ọnwa Jenụwari afọ a:

1. agric, adj. & n. -Nke bụ mkpọbiri 'Agrịculture'- orugbo

2. barbing salon, n.- Ebe a na-akpụ isi

Ọdọ ọkpụisi

Ebe foto si, Getty Images

3. buka, n. Ụlọ nri okporoụzọ

4. bukateria, n. - Ụlọ nri okporoụzọ

5. chop, v./6- Iri

6. chop-chop, n./2 - Iri ego ọha, nrụrụaka

7. danfo, n. - Obere ụgbọala e ji achụ nta ego

Danfo

Ebe foto si, Getty Images

8. to eat money, in eat, v. - Iri ego

9. ember months, n. - Ọnwa mba mba

10. flag-off, n. to flag off in flag, v.- Ibido

11. gist, n./ gist, v./2 - Akụkọ/ Ịkọ akụkọ

12. guber, adj. - Ihe gbasara ọkwa gọvanọ

13. Kannywood, n. - Ndị na-eme ejijie Ugwu Awusa

14. K-leg, n. - Ụkwụ ngọ

15. mama put, n. - Osinri na-anọ n'okporoụzọ

Osinri ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, 'Buka', osinri ahịa okporoụzọ so n'okwu ọhụrụ banyere 'Oxford Dictionary.'

17. Next tomorrow, n. & adv. - Nwanne echi

18. non-indigene, adj. & n. Onye abụghị nwa amaala

19. okada, n. oji ọgbatumtum achụ nta ego

Ókada

Ebe foto si, Getty Images

20. to put to bed, in put, v. Ịmụ nwa

21. qualitative, adj.- Ịdị ezigbo mma

22. to rub minds (together) in rub, v./1 - Itikọta isi chee echiche

23. sef, adv. - Onwe

24. send-forth, n. - Mziga maọbụ mzipụ

25. severally, adv. - Ugboro ugboro

26. tokunbo, adj. - ụgbọala maọbụ ngwa ahịa si aka fere aka

27. zone, v. - Mpaghara

28. zoning, n. - Ike na mpaghara na mpaghara

'Ain't' sokwa

Ọ bụghị sọ okwu Naijiria banyere akwụkwọ nkọwa okwu n'afọ 2020.

'Ain't so na ụfọdụ okwu Bekee anaghị akpọbu okwu zuru oke a gụnyere n'okwu zuru oke na akwụkwọ nkọwa okwu.

'Ain't' bụ okwu e ji akọwa 'ọ bụghị,' 'abụghị m', 'ha abụghị' bụ okwu anabatara dịka okwu zuru oke na Bekee.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: