ELECTION JARGONS BUSTER: Nkọwa okwu mgbagwoju anya maka ntuliaka

Ndi na-ahazi atum vootu

Ebe foto si, Getty Images

Asụsụ pụrụiche nke ntuliaka afọ 2019

Kedụ ndiche dị na nyocha ntuliaka na nkiri ntuliaka? Imegharị ntuliaka n'ebe niile na imegharị ntuliaka n'ụfọdụ ebe?

Dịka ntuliaka ọnwa Febụrụwarị na Maachị afọ 2019 na-abịa nso, ị ga na-anụ ọtụtụ okwu dịka ndị a, ihe a bụ nduzi dị mfe iji hụ na ị matara ndiche ha.

A


Accreditation (Ikikere) : Ihe a bụ usoro eji achọpụta ndị ntuliaka tozuruoke ibinyeaka tupu ntuliaka amalite.

B


Ballot box (Igbe ntuliaka) : Igbe ekpuchiri ekpuchi nwere ohere n'elu ya bụ ebe ndị na-eme ntuliaka na-atụba akwụkwọ ntuliaka ha.

Ballot paper (Akwụkwọ ntuliaka) : Akwụkwọ bu aha ndị na-azọ ọkwa nke dị n'usoro agbụrụ ha si.

Bye-election (Ntuliaka nhọpụtagharị) : Nke a bụ ntuliaka a na-eme iji dochie ọkwa n'ụlọomeiwu nke onye nọ n'ebe ahụ nwụrụ anwụ. Onwereike ime mgbe onye nọ n'ọkwa ahụ etozughi oke ị na-achị; n'iheatụ, n'ihi nkpọghachị maọbụ mgbe ntuliaka e mere n'ezighi ezi.

C


CVR : Ndebanye aha maka ntụlịaka.

Card reader (Igwe Kaadị rida) : Igwe Kaadị rida bụ igwe a na-eji enyocha kaadị PVC iji mata ma ọ bụ nke onye ahụ.

Claim (Mgbarakwa) : Nke a bụ usoro eji ama ọkwa nyelụ INEC n'oge ngosi na aha onye debanyere aha ya aputaghị ma ọbụ na asụpeghị aha ya nke ọma.

D


Display (Ngosi) : Nke a bụ usoro eji eme mbido ndebanye aha ka ọ dịrị ọha maka ndozi ọbụla dị mkpa.

E


EMB : Election Management Body.(Ihe a bụ otu na-ahazi ntuliaka) e nwere ndị otu n'ụzọ iri asa na asatọ na Naịjirịa. Ụlọọrụ INEC na ndị nke Steeti iri atọ na isii bụ States Independent Electoral Commissions (SIECs).

Election Monitors (Ndị nyocha Ntuliaka) : Ndị na-enyocha ntuliaka bụ ọrụ INEC ụlọọrụ ahụ zipụrụ iji leba anya na nhazi ntuliaka.

Election Observers (Ndị na-ekiri ntuliaka) : Ndị na-ekiri ntuliaka bụ ndị otu ha ahọpụtara bụkwa nke INEC kwadoro ikiri usoro niile eji eme ntuliaka (ikesa ihe eji eme ntuliaka, nzere ntozuoke, ngụkọta ihe mpụtara na nkwupụta onye meriri na ntuliaka). E nwere ndị nkiri ntuliaka ụzọ abụọ dịka nke ụlọ na nke mba ndị ọzọ.

G


General Elections (Ntuliaka Ọha) : Ntuliaka ọha bụ nke a na-eme na mba niile n'ogogo ọbụla, kwa mgbe iji họpụta ndị ndu ọhụrụ ga-anọchi anya ndị na-achị na ngwụcha oge ọchịchị ha.

I


INEC : Independent National Electoral Commission.

Inconclusive election (Ntuliaka na-apụtaghị ihe) : Nke a bụ ntuliaka ebe ọnụọgụgụ ndị debanyere aha adịghị mma nke mere na a kagburu ha, maọbụ a gbatịa ntuliaka ahụ. Nke bụ na ọnụọgụgụ ndị a nwereike ịgbanwe mpụtara ntuliaka n'ebe ndị o metụtara.

M


Manifesto : Nke a bụ akwụkwọ otu pati dere iji gosi atụmatụ na ebumnuche ha na etu ha ga-esi chịa ma ha merie na ntụliaka. Ọ na-akọwakwa ịhe pati ahụ kwụnyere na-etu ha ga-esi kwalite ọdi mma ndị mmadụ.

N


Nomination (Nhọrọ) : Nhọrọ so n'otu n'ime usoro ndị otu ndọrọ ndọrọ ji ahọpụta mmadụ maka ịzọ ọkwa ọchịchị.

O


Objection (Nkatọ) : Nke a bụ ekwenyeghị na INEC gbasaara itinye aha mmadu na akwụkwọ mbido ndenye aha n'ihi na onye ahụ erughị eru.

Open secret ballot system (Ntuliaka nzuzo pụtara ihe) : Ihe a bụ usoro ebe onye na-eme ntuliaka ga-ebinyeaka n'akwụkwọ ntuliaka ma tukpuo ya n'igbe ntuliaka (Ibinyeaka ya) n'ihu ọha na eze.

Opposition (Otu pati na-anọghị n'ọchịchị) : Otu pati ndọrọndọrọ kachasị na-anọghị n'ọchịchị ka a na-akpọ, pati na-anọghị n'ochịchị.

P


PRV (mbido ndebanye aha maka ntụlịaka.) : Nke a bụ mbido ndebanye aha maka ntụlịaka bụ akwụkwọ nwere aha na ihe ndị ọzọ gbasara ndị chọrọ ịtụ ntụlịaka. E gosipụtara kọpị akwụkwọ ndebanye aha ahụ ka ọha were nyochaa ya. Ọnwee nkatọ na mkpesa dị na ya banyere aha ewepụrụ ma ọbụ tinye na akwụkwọ ndebanye aha ma ọbụkwazị welite ndozi dị mkpa.

PVC : Kaadi ndebanye aha maka ntụlịaka.

Party Agent (Onye ọrụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị) : Onye ọrụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ onye na-anọchite anya otu ahụ maọbụ nke ọnye na-azọ ọkwa n'ebe mbinyeaka maọbụ ebe ngụkọ vootu n'ụbọchị ntuliaka.

Party primary : Otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị bụ usoro eji ahọrọ ndị na azọ ọkwa ga anọchite anya pati ha na ntụlịụka.

Polling Unit (Ebe Mbinyeaka) : Ebe Mbinyeaka bụ ebe ọha, ogige maọbụ nwere nche nke ụlọọrụ INEC hiwere dịka ebe a na-ebinyeaka.

R


Re-run election (Mmegharị ntuliaka n'ebe niile) : Mmegharị ntuliaka n'ebe niile bụ ntuliaka a na-eme nke mbụ e mere jupụtara na nrụrụaka maọbụ mgbe a na-ejighi ezi usoro.

Recall (Nkpọghachị) : Nkpọghachị bụ usoro ndị ntuliaka ji ewepu onye ndu ha họpụtara n'ọchịchị obodo, steeti maọbụ nke ụlọomeiwu

Rejected ballot (Mbinyeaka ajụrụajụ) : Mbinyeaka ajụrụajụ bụ ụdị mbinyeaka ebe nhọrọ onye binyere aka na-edoghi anya dịka ọ bụrụ ebe onye ahụ binyereaka n'etiti njiri mara otu abụọ maọbụ na onweghi ebe ebiri aka n'akwụkwọ ntuliaka ahụ. A ga-ajụ ụdị mbinyeaka ahụ, a gaghị agụnyere ya otu ọbụla.

Return (Nlọghachi) : Nke a pụtara nkwupụta otu onye meriri na ntụlịaka nke iwu ntụlịaka kwadoro otu onye ọrụ ikwupụta na ntụlịaka ọbụla.

Returning Officer (RO) : Onye a bụ onye ọrụ INEC na-ekwupụta ihe bụ mpụtara nke ntuliaka.

Run-off election (Mmegharị ntuliaka n'ụfọdụ ebe) : Ihe a bụ ntuliaka a na-eme mgbe nke mbụ e mere ezughi iji họpụta onye meriri n'ọkwa Onyeisiala maọbụ Gọvanọ n'ụzọ doro anya. Nke a nwereike ime mgbe onye nwe vootu kachasị n'ọnụọgụgụ na-enweghi vootu zuruoke si na Steeti maọbụ Mba o metụtara.

S


SIEC : State Independent Electoral Commission. (Steeti ọbụla nwere otu na-ahazi ntuliaka okpuru ọchịchị obodo ya).

T


Tactile Ballot Paper (Akwụkwọ ntuliaka a na-ahụ anya) : Ha bụ akwụkwọ ntuliaka a rụrụ n'ụdị pụrụiche nke ga-enyere onye na anaghị ahụcha ụzọ nke ọma aka ihọrọ onye ọ chọrọ n'akwụkwọ ntuliaka na-enweghi enyemaka ọbụla. (nke bụ na nzuzo, n'ọnwe ya)

Tendered ballot paper (Akwụkwọ ntuliaka onyinye) : Ihe a bụ akwụkwọ ntuliaka a na-enye mmadụ mgbe achọpụtara na onye ọzọ ebinyelaaka n'aha ya. E detuchaa ya a na-enye ya onyeisi ọrụ ntuliaka ma ghara itinye ya n'ime igbe ntuliaka.

Turnout (Ntụgharịpụta) : Ọnu ọgụgụ ma ọbụ pasentị ndị tozuru itụ votu na kọnstituensi tụgharịpụtara ịtu ya bụ votu.

Ebe o si

INEC Naịjirịa, BBC