Chelsea vs Arsenal: Chelsea na Arsenal adọrọla ka ofe ọkwụrụ gbara ụka

Ebe foto si, Getty Images
Arsenal takwutere ya kọnkịrị n'aka Chelsea mana ha gosiri ike dimkpa iji jide onwe ha.
Otu abụọ a nyere onwe ha goolu abụọ abụọ oge ha zutere na 'Stamford Bridge' n'aabalị Tuzde.
Ndị Chelsea che na asọmpi ahụ ba-abụ ofe nkupu mana ha hụrụ nke tọrọ 'Bịati'.
Oteghi aka asọmpi a malitere, David Louis gbaturu Tammy Abraham n'ime obi goolu ha nke mere ka a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi ma nye Chelsea penariti.
Gorginho gbakpuru penariti ahụ wee gbaara Chelsea aka ahịa.

Ebe foto si, Getty Images
Chi ndị Arsenal zọrọ ha oge bọọlụ kụrụ Saka n'aka n'ime '18' mana ogbu opi ahụghị ya.
Na nkeji 63, Gabriel Martinelli nyere goolu dị ebube wee saara ndị Arsenal ọnụ ha.
Chelsea nyere goolu ọzọ si n'aka Ceaser Azpilicueta.
Mana na nkeji 88 ka Bellerin nke Arsenal sakwara ya.
Otu a ka ya bụ egwu si bee.

Ebe foto si, Reuters
N'asọmpi ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde, Manchester city ji otu ọkpụ goolu merie Sheffield United.
Aston Villa si azụ owere lọghachi wee merie Watford 2-1.
Bournemouth na Brighton gbara 3-1, ebe Southampton meriri Crystal Palace 2-0.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











