2022 World Cup : E tinyeela Nigeria na 'Group C"

Ndị 'Super Eagles'

Ebe foto si, @NGSuperEagles

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

E tinyeela otu egwu Super Eagles na Group C n asọmpị iji tozuo ị ga Iko Mbaụwa nke ga-amalịte n'ọnwa Oktoba afọ 2020.

Mba ha na Nigeria nọ na otu ahụ bụ Cape Verde, Central African Republic nakwa Liberia.

Ndị Algeria, Burkina Faso, Niger, Djbouti nọ na 'Group A.'

Tunisia , Zambia, Mauritania, Equitorial Guinea, nọ na Group B.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ndị omeiwu itoolu n'Imo steeti amabaala APC

Ime ụlọomeiwu Imo steeti
Nkọwa foto, Ime ụlọomeiwu Imo steeti

Mmadụ itoolu ndị omeiwu Imo steeti a hapụla pati ha mabanye na APC.

Nke a na-eme n'ọgbakọ mbụ ụlọ omeiwu steeti ahụ na-enwe kamgbe Hope Uzodinma nke APC banyechara n'oche gọvanọ.

Ndị omeiwu ahụ gụnyere:

  • Isu - Ngozi Obiefule
  • Nwangele - Chyna Iwuanyanwu
  • Okigwe - Obinikpa Chidiebere
  • Ideato North - Arthur Egwim
  • Ideato South - Duru Johnson
  • Ohaji/Egbema - Cyriacus Okoro
  • Onuimo - Paul Emeziem
  • Orsu - Ekene Nnodumele
  • Nkwere - Obinna Okwara
Okey Onyekanma

Ebe foto si, IMSHA

Nkọwa foto, Okey Onyekanma

N'ime ọgbakọ a ka osote onyeisi ndị omeiwu ahụ aha ya bụ Okey Onyekanma nọkwara kwuo na ya agbaala arụkwaghị m.

Onyekanma ritukwara dịka onyeisioche kọmiti na-ahụ maka etu ndị ọgbakọ ndị omeiwu si aga.

Onyekanma kwuru na ihe ya ji aritu n'ọkwa bụ ka onye si mpaghara Ọlụ were ya bụ oche dịka nkwekọrịta ha nwere sị dị.

Akụkọ ọzọ malitere ifegharị na onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti bụ Collins Chiji esila PDP baa APC.

Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na nke ahụ abụghị ezie.

Anyị amachibeghị ọkada na keke - Gọọmentị Legọs

Keke

Gọọmentị Legọs akọwaala na ha amachibeghị ọkada na keke ịgba n'okporoụzọ awaraawara nakwa akwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ.

Nkọwa a na-abịa dịka akụkọ malitere ifegharị na-ekwu na a machiela ha.

Kọmishọna mgbasa ozi na Legọs bụ Gbenga Omotoso kọwara na ha ka-naeleba anya n'okw gbasara ọkada na keke mana ha enwebeghị mkpebi ọbụla gbasara ya.

Omotoso kwuru na akụkọ gbasara mmachị keke "abụghị eziokwu".

Ortom na Fintiri emeriela

Samuel Ortom

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe kachasị ekpebiela ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti Benue nakwa Adamawa.

Ha kwuru na Samuel Ortom na Umar Fintiri bụ ndị meriri ya bụ ntụliaka n'otu n'otu.

Malabu

Mohammed Adoke

Ebe foto si, Twitter/EFCC

Gọọmentị etiti akpụpụla Mohammed Adoke ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka na iri aka azụ n'okwu gbasara ụmị mmanụ agbidi a kpọrọ 'Malabu oil well'.

Adoke bụ onye ji ọkwa Ọkaiwu gọọmentị etiti n'oge Goodluck Jonathan ji ọkwa onyeisi ala.

O teela aka gọọmentị etiti boro Adoke ebubo a, mana ọ gbara ọsọ gbaga obodo Dubai.

Ndị uwe ojii mbaụwa bụ 'Interpol' mechara nwụchie ya n'ọnwa Novemba afọ 2020 ma kpụlata ya Naịjirịa na Disemba.

Mana Adoke ekwuola ugboro ugboro na ya adaghị iwu ọbụla kama na ya mere ihe onyeisiala oge ahụ bụ Jonathan gwara ya ka ya mee.

Ọ bụghị naanị Adoke ka gọọmentị etiti gbara akwụkwọ a.

Ndị ọzọ gụnyere Aliyu Abubakar, Rasky Gbinigie, ụlọọrụ mmanụ agbidi bụ Shell, ụlọorụ Agip, nakwa ụlọọrụ Malabu.

Liman Andimi

Ụkọchukwu Lawan Andimi

Ebe foto si, Twitter/@A_Salkida

Nkọwa foto, Ụkọchukwu Lawan Andimi

Ndị otu Boko Haram egbuola onye isi otu 'Christian Association of Nigeria' (CAN) nke okpuru ọchịchị Michika dị n'Adamawa steeti.

Aha ya bụ Lawan Andimi.

Ọ bụ onye ntaakụkọ aha ya bụ Ahmad Salkida kọwapụtara nkea.

Salkida kwuru na ndi Boko Haram bepuru Andimi isi, ya na otu onye agha Naịjirịa ọzọ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

O kwuru sị: "Andimi bụ onye isi ụka, nna, nakwa onyendu obodo ya."

Salkida kwukwara na ọ bụ n'ehihie ụbọchị Monde ka e gburu Andimi.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ndi Boko Haram nwụchiri Andimi oge ha wakporo obodo Michika na mbido ọnwa a.

Ha gosiri ya n'ihe onyonyoo ebe ọ na-arịọ ka gọọmentị gbatara ya ọsọ enyemaka.

Mana enyemaka ahụ abịaghị.

Gọọmentị Naịjirịa ekwubeghi ihe ọbụla gbasara nke a.

'Lassa Fever'

Rats

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Oke na-ebutekarị ọrịa 'Lassa fever'

Ọrịa a na-eche na ọ bụ Lassa egbuola ndị dọkita anọ na otu onye ọzọ n'ụlọọgwụ mahadum Aminu Kano nke dị na Kano steeti.

Otu n'ime ndị isi ụlọọgwụ ahụ aha ya bụ Imam Bello gwara ndị ntaakụkọ na e zigala ọbara ndị ahụ nwụrụ anwụ ka e nyochaa ya mata kpọmkwem ihe gburu ha.

Mkpụrụ okwu 'Oxford Dictionary' nke 2020

Akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary'

Ị ma na ụfọdụ okwu e jiri mara ndị Naijiria abanyela n'akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020?

Okwu ndị a gụnyere ọkada, buka, k-leg, agric, danfo, chop chop, barbing salon, dịrị gawazie.

Buhari ezutela Boris Johnson

Muhammadu Buhari na Boris Johnson

Ebe foto si, Bashir Ahmed/Twitter

Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla mba Briten ka ha nyere Naịjirịa aka nyochaa ndị niile nwere ebubo mpụ na nrụrụaka gbatara ọsọ izendụ na mba ha.

Ọ rịọrọ nke a mgbe ya na Praịm Minista Briten bụ Boris Johnson na-akparịtaụka ime ụlọ n'ọgbakọ UK-Africa Investment Summit 2020 a na-eme na Lọndọn ugbua.

Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu wepụtara dịka ọgbakọ a na-aga n'ihu.

Buhari sị na ọchịchị ya na-agba mbọ n'ibu agha megide mpụ na nrụrụaka ma e nwere ụfọdụ ọgbateuhie dị n'ụzọ.

Buhari na Akufo-Addo

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter

N'otu aka ahụ Buhari gwara onyeisiala Gana bụ Nana Akufo-Addo na ihe o ji gbachie okeala Naịjirịa abụghị naanị maka mbubata nri, kama na ịtụ mgbere ngwaagha na ọgwụike sokwa.

Akufo-Addo na nzaghachị ya sị ka Buhari gbapụ ya ọsọ na nyocha banyere nke a n'ihi oke uru Naịjirịa baara Ghana.

Gịnị ga-eme n'ụlọomeiwu Imo Steeti

Ọfọ ụlọomeiwu

Ebe foto si, Twitter/Nass

Anya niile nọ n'ụlọomeiwu Imo Steeti ugbua dịka ha ga-amalite nzukọ ha nke mbụ n'okpuru ọchịchị gọvanọ Hope Uzodinma.

Cheta na ndị a gara ezumike Ekeresimesi n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba 2019, mgbe Emeka Ihedioha ji ọkwa gọvanọ.

N'ofesi

Ọrịa Coronavirus egbuola ihe ruru mmadụ anọ

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọrụ ahụike na mba Chaịna achọpụtala na ọrịa iku ume a kpọrọ Coronavirus nwereike isi na mmadụ fee na mmadụ site mmekọrịta ahụ.

Dịka ọ dị ugbua ọrịa a egbuola ihe ruru mmadụ anọ ebe ọtụtụ ndị gụnyere ndị ọrụ ahụike nọ n'ọnọdụ ọjọọ.

Emiliano Sala

Emiliano Sala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Emiliano Sala

Taa ka o mere otu afọ kpọmkwem ọgba bọọlụ bụ Emiliano Sala lara mmụọ dịka ụgbọelu ya kpọkasịrị oge o si mba Fransị na-aga otu egwuregwu ọhụrụ ya bụ Cardif City.

Na mkparịta ụka ya na BBC, Nne Sala kwuru na ọnwụ nwa ya ka na-agbawa ya obi nke ukwu na-agbanyeghị na ọ gaala otu afọ ya bụ ihe mere.

Chelsea chọrọ Cavani

Edinson Cavani

Ebe foto si, AFP

Onye nchịkọta Chelsea bụ Frank Lampard ekwuola na uche ya dị n'ịzụ Edinson Cavani bụ onye chọrọ isi na PSG pụọ.

Lampard sị na Chelsea kwesịrị mwulite ka ha nwee ike tozuo oke n'asọmpi Champions league afọ na-abịa.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Ọgba Mbọ: Ịrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn