UK-Africa summit: Etu Britain nwereike isi chụta Africa ka nwaanyị

Ndị nrụpụta mmanya nke Stellenbosh si na Cape Winelands, bụ nke kacha eto eto na nrụpụta mmanya na mpaghara ndị dị na Saụt Afrịka n'ụbọchị 19 nke Epreelụ 2017

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-arụpụta mmanya na mba Saụt Afrịka ga-achọ ka gọọmentị ha kwekọrịta maka ụzọ ka mma isi ebubata mmanya ha n'ahịa mba Briten

E mechaa Brexit, Briten ga-achọ ikwalite ọnọdụ azụmahịa dị n'etiti ha na Afrịka, mana dịka a na-eme nnukwu nzukọ n'etiti UK na Afrịka na Lọndọn, Matthew Davies na-ajụ ma Afrịka ọ ga-erite uru ọhụrụ n'ime ya?

Ihe gbasara azụmahịa nwere etu ọ dị. Nkwekọrịta azụmahịa na onwe ya gbagọkwuru agbagọ. Mkparịtaụka gbasara etu nkwekọrịta a ga-esi abịa kacha taa akpụ.

Mana a gbakatala ụkwụ n'ụzọ Brexit ga-esi tinye aka kemgbe, na oge na ha aga.

Mgbe UK ga-esi na 'European Eunion (EU)' apụ na ngwụcha ọnwa Jenụwarị a, o nwere naanị ọnwa iri na otu iwepụta atụmatụ azụmahịa ga-adabara ha na ndị EU, iji zere ịlaghachị n'iwu World Trade Organization (WTO).

Boris Johnson zutere ndị ojiego achụ ego n'ụlọ nnọchiteanya Briten, n'isiobodo Accra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na ndị ọzọ nke Bekee kpọrọ 'foreign' Secretary', Boris Johnson gara mba Gana n'afọ 2017

Boris Johnson bụ Praịm Mịnịsta na ndị na-akwado atụmatụ ya ka Briten si EU pụọ, na-ekwukarị maka uru dị n'ọpụpụ, nke gụnyere ikike iji aka ha ekwekọrịta n'ọnọdụ azụmahịa ndị ụmụ amaala ha.

Iso na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nwere uru na ọghọm.

N'eziokwu, ị ga-ekwenye n'ụfọdụ ihe ma gbanwee nzube gị ka ya na atụmatụ ndị ọzọ kwekọrịtara n'ime ya dabanye. Mana ị ga-enwetekwa ikike ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'okwu nkwekọrịta azụmahịa.

Uru Naịjiria ga-erite na Brexit

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na ụfọdụ ndị ọzọ nọ na Lọndọn na-akpa maka nkwekọrịta a, ịmata etu Naịjirịa na ndị ọzọ ga-esi rite uru.

BBC na Abubakar Ali bụ onye ọnụ na-eru n'okwu kpara maka uru Naịjirịa ga-eritenwu, o kwuru sị:

  • Naịjirịa nwere nnukwu ahịa nke bụ na ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ itinye ego ha na mba a
  • Ndị mmadụ ga-enwe ohere ịnata ọzụzụ n'ọrụ aka nakwa ihe ndị ọzọ, makana ụlọorụ chọrọ ihibe ụlọorụ ha ebe a, ga-achọ ịzụ ndị mmadụ n'ụdị ọrụ ha na-arụ
  • Ọtụtụ okporoụzọ a na-arụ na Naịjiria ugbua bụ ndị Chaịna na-arụ ya, mana nkwekọrịta a dị n'etiti Briten na Naịjirịa, e nwereike igbo nsogbu ụzọ ọjọọ.
  • Ọ bụrụ na uru ndị a nwee isi na Naịjirịa, ọ ga-ewetarịrị ọrụ nye ndị na-achọ ọrụ, ma nyere aka igbanwe ndụ ndị ogbenye Naịjiria.

Kedụ ọnọdụ Afrịka ga-anọ?

Alok Sharma bụ onye na-ahụ maka mmepe obodo mba Briten na ndị ozọ, na-enwe nchekwube na mmekọrịta Briten na Afrịka ga na-apụ ọkụ, n'ụzọ gụnyere azụmahịa, iji ego achụ ego nakwa itinye ego n'azụmahịa a ga na-eme aghara aghara.

Gọọmentị Briten bu ya n'obi ọfuma.

E nwereike ịhụta ọgbakọ itinye ego n'azụmahịa nke UK na Afrịka na-eme ugbua dịka nkọwa ezigbo ebumnobi ahụ, mana mgbanwe ọbụla nwereike ịbịa ga-ete ezigbo aka tupu ọ bịa.

Gịnị ga-agbanwe mgbe Briten ga-apụ na EU?

Enweghi ihe ga-agbanwe na ngwụcha Jenụwarị a.

A ga-ekwu ọtụtụ okwu n'ọha ma mee ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, mana ndị Briten ka ga-abụ onye otu 'EU Customs Union' ma sorokwa n'ahịa ha, ruo na ngwụcha afọ.

Enwere atụmatụ ka a dọtịa ya rukwuo afọ abụọ, mana ọ dị ka ihe Johnson agaghị eme.

Ọ pụtara na nkwekọrịta maka azụmahịa dị n'etiti Briten na Afrịka ga-anọ etu ọ nọ ruo afọ 2020, n'okpuru nkwekọrịta EU na mpaghara ahụ nwere.

Gịnị ga-eme ma 2020 gachaa?

Ụfọdụ nkwekọrịta azụmahịa dị n'etiti Briten nweterela Brexit na ụfọdụ mba dị n'Afrịka ka ga-adị etu ọ dị ma 2020 gachaa.

Ya bụ na ọnọdụ azụmahịa dịka (ego ole a na-ana, oke ole a na-eketa, ụkpụrụ ahịa dgz) ka ga-abụ ihe ọ bụ n'etiti ụfọdụ mba Afrịka nakwa ndị EU.

Ịma atụ, n'ọnwa Septemba 2019, Briten na mba ndị si mpaghara ndịda-anyanwụ gụnyere Saụt Afrịka, Bọswana, Namibia, Lesoto, Mozambik na eSwatini a ma dịka Southern African Customs Union (Sacu), banyere na nkwekọrịta azụmahịa.

Ndị ha na Briten na-aka azụkọ ahịa (2016). Ego ole a na-etinye n'azụmahịa $bn. .

E mere ya ka o dewe ihe n'ọnọdụ ọ nọ n'ime nkwekọrịta mba ndị ndịda-anyanwụ Afrịka na EU nwere.

Ọ dị ka nkwekọrịta EU na Sacu nwere.

Dịka Liz Truss bụ onye na-ahụ maka azụmahịa mba Briten na ndị ọzọ si kwuo, nkwekọrịta a "ga-ekwe ka ndị azụmahịa ka nwee ike na-azụ ahịa ma Brexit mechaa, na-enweghi mgbochi ọbụla".

Ndị ha na Briten na-aka azụkọ ahịa (2018). Ego ole a na-etinye n'azụmahịa $bn. .

Briten na ihe ruru mba 70 ọzọ ha na EU nwere nkwekọrịta a, ekwekọrịtakwala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, "Ihe anyị chọrọ ka Theresa May mere anyị"