Supreme Court: Ganduje na Tambuwal enweela mmeri n'Ụlọikpe Ukwu

Ụlọikpe kachasị achabiela ikpe abụọ n'ime atọ ha na etinye ọnụ n'ụtụtụ a.
Na nke Kano, Ụlọikpe Ukwu sị ọ bụ Abdullahi Ganduje nke APC meriri dịka gọvanọ Kano Steeti n'ezie.
Na nke Sokoto Ụlọikpe sị na ọ bụ Aminu Tambuwal nke PDP bụ onye meriri.
Gọvanọ Bauchi bụ Bala Mohammed na nke Plateau bụ Simon Lalong nwetakwara mmeri.

Ime ụlọ ebe a nọ kpee ikpe ndị a juru n'ọnụ n'ụtụtụ Monde.
Ọtụtụ ndị ọkaiwu ahụghị ebe ha ga-anọ ọdụ n'ime ụlọikpe dịka o jupụtara n'igwe mmadụ.

Ngagharị nkwad Uzodinma

Ndị nkwado pati APC mere ngagharị n'Owere, isi obodo Imo steeti iji kwado Gọvanọ Hope Uzodinma.
Ọtụtụ ndị mmadụ nupụtara n'igwe isonye na ngagharị a.
Ha yicha akwa ọcha, ma na-agụ egwu nkwado na-egosiputa obi ọma ha maka mkpebi ụlọikpe kachasị nke nyere Uzodinma mmeri.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ngagharị nkwado a bụ iji saa ndị pati PDP bụ ndị mere ngagharịiwe ụbọchị Sọnde.
PDP na ndị nkwado ha na-ekwu na mwepu Emeka Ihedioha bụ ikpe mara eziokwu.
Ha kwuru ka e lebagharịa ya bụ ikpe anya maka na o gosipụtaghị mbunuche ndị Imo.
Ndị isi PDP mere ngagharịiwe n'Abuja ụbọchị Monde

Ebe foto si, Twiter/PDP
Ngagharịiwe ahụ rukwara na steeti ndị ọzọ dịka Abia, Akwa Ibom nakwa Katsina.
N'ụbọchị Monde, ndị isi PDP mere ngagharịiwe gaa n'ogige 'Supreme Court' iji gosipụtakwa iwe ha.
Mbaka etinyela ọnụ n'okwu
Dịka ngagharịiwe na-arị ibe ya elu, ụkọchukwu katọlik n'Enugwu bụ Fada Mbaka na ndị otu ekpere ya bụ 'Adoration Ministry' atụọla mmamma maka mmeri Hope Uzodinma.
Cheta na Mbaka buru amụma na mbido afọ 2020 na Uzodinma ga-achụpụ Emeka Ihedioha dịka gọvanọ Imo steeti.
N'okwuchukwu ya, Mbaka dọrọ ndị na-akatọ ya aka na ntị ka ha kwụsị ime nke a n'ihi na Chineke ga-alụrụ ya ọgụ.
O kwukwara na ya kpere ekpere ma buo ọnụ ọtụtụ ụbọchị ruo mgbe amụma ahụ mezuru.
Ihe i kwesịrị ịma maka ọkụ gbara n'Abule Egba

Ebe foto si, Getty Images
Okporo mmanụ ndị Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) agbagbuola mmadụ ise n'ọkụ nakwa ọtụtụ akụnaụba na mpaghara Ile Epo dị n'Abule Egba, Legọs steeti.
Ndị ọrụ gbata gbata nke Legọs bụ Lasema sị na okporo mmanụ a bụ nke ndị mmadụ kupuru akupu baara ọkụ a ma tinye ụjọ n'etiti ndị bi n'ogbe ahụ.
Onyeisi ha bụ Olufemi Damilola Oke-Osayintolu si na ha na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ agbanyụọ ọkụ ahụ.
Ọ sị na ọ bụ etu ha si zaa oku a kpọrọ ha n'oge nyere aka iji hụ na a gbanyụrụ ọkụ ahụ.

Ebe foto si, LASEMA
Ihe ndị ọkụ gbara;
Mmadụ ise nwụrụ (okenye ụmụnwoke atọ, okenye nwaanyị otu, otu nwata dị afọ ise)
Mmadụ iri abụọ merụrụ ahụ ebe mmadụ otu narị na iri abụọ enweghi ebe obibi.
Ụlọ obibi iri na otu
Ụlọ ahịa iri na asaa
Ụgbọala ukwu (Truck) iri atọ na atọ
Ụgbọala nta (Car) atọ
Ọgbatumtum (Keke) atọ.
Mwakpo ndị Boko Haram

Ebe foto si, AFP
Otu mbaụwa bụ United Nations agbarụọla ihu maka mwakpo ndị otu oyi egwu Boko Haram wakporo ụlọ ebe ndị ọrụ enyemaka bi n'obodo Ngala dị na Borno Steeti.
Onye ji ọkwa UN Humanitarian Coordinator bụ Edward Kallon kwuru na ya bụ mwakpo jọgburu onwe ya mana obi ụtọ ya bụ na onweghị onye nwụrụ na ya bụ mwakpo.
N'ofesi

Ebe foto si, EPA
Akụkọ na-ekwu na ọrịa iku ume a kpọrọ Corona virus nke gburula mmadụ atọ, agbasaala n'ọtụtụ obodo dị na mba China.
Otu na-ahụ maka ahụike na mbaụwa bụ World Health Organisation sị na ihe kpatara mmụbanye ọrịa a bụ oke ọchịchọ na nyocha banyere ya.
Ọrịa a emetụtala ihe ruru mmadụ otu narị, iri atọ na itoolu n'ime obodo ndị ahụ na mba Chaịna.
Ndidi agbakeela

Ebe foto si, Getty Images
Nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi onye na-agbara Leicester City bọọlụ agbakeela na mmerụ ahụ o merụrụ na abalị itoolu nke ọnwa Janụwarị.
O sorola ndi otu ya na-agbaghari ọsọ ma na-emekwa nkwado.
A na-atụ anya na Ndidi ga-eso n'egwu oge Leicester ga-ezute Aston Villa n'asọmpi 'league cup' na ngwucha ọnwa a.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị nkwado Manchester United na-eti mkpu n'elu Twitter sị ka a chụọ onye nchịkọta ha bụ Ole gunna Solskjaer.
Nke a na-abịa dịka Liverpool ji ọkpụ goolu abụọ asaghị asa nyụọ ha ịkpakwụ n'asọmpi Premier League ụnyaahụ.
Nkeji
Ihe nkiri












