Watford vs Arsenal: Nkata ndị Watford ekpudola Arsenal

Sokratis

Ebe foto si, Reuters

Goolu abụọ Pierre-Emerick Aubameyang nyere na ezughi inye ndị otu egwu bọọlụ Arsenal mmeri na asọmpi Premier League ha na Watford na mgbede ụbọchị ụka.

Ndi nkwado Arsenal chekwa na ụbọchị ha amaala mma mgbe Aubameyang mere ka o si eme wee gbakaa neetị na nkeji 21.

Oteghi aka, na nkeji 32, Aubameyang nyekwara goolu ọzọ.

Pierre-Emerick Aubameyang na Kolasinac

Ebe foto si, Reuters

Mana ka agba nke abụọ malitere, ndị Watford bidoro gosiwe ike ha.

Na nkeji 53, ndị Arsenal nọ n'ihu be ha na-ama ụkwa mgbe Tom Cleverly nachaara ha bọọlụ gbakaa neetị.

Pereyra

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Roberto Pereyra na Delofeu

Ka nke ahụ mechara, Daviud Luiz, bụ onye e ji nde paund asatọ zụta n'aka ndị Chelsea, gbatara penariti na nkeji 81.

Roberto Pereyra egbughi oge ọbụla ịgbakpu penariti ahụ iji saa goolu abụọ ahụ.

Arsenal emeribeghi asọmpi atọ ikpeazụ ha.

Cheta na Liverpool gwọrọ Arsenal ka abacha e tinyere ose Nsukka n'ọnwa Ọgọst.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe chere ndi si South Africa lọta