Igbo People: Ihe 10 mere ndị Igbo ji akpa ike n'akụkụ ụwa ọbụla ha nọ

Ebe foto si, Lilian Fidelis/BBC/Chigozie Oguine
- Onye dere ya, Chioma Obianinwa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Che che che che Igbo Kwenu!!!!! Yaaaaa.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo na-ekwu ọtụtụ mgbe n'obodo ọbụla ị gara ma ị na-ahụghị onye Igbo, mara na ya bụ ebe adịghị mma obibi.
N'agbanyeghị na ndị Igbo bụ ndị pekarịcharịsiri mpe n'agbụrụ atọ kachasị na Naịjirịa, ha nọcha n'akụkụ mba ụwa niile.
Mana ọ ga-adị mma ka anyị leba anya mara ihe na-aka ndị Igbo obi n'ebe nille ụwa soturu.
1.Okwukwe n'ime ụmụ ha

Ebe foto si, Getty Images
Chigozie Oguine bụ onye ji ego achụ ego na mba Amerịka kamgbe afọ iri abụọ kwuru na okwukwe ndị Igbo nwere n'ebe ụmụ ha nọ so ebunye ha iru ọma ebe ọbụla ha nwetere onwe ha.
O kwuru na onye Igbo ọbụla mụrụ nwa na-enwe okwukwe siri ike na nwa ahụ ga-emeriri ọfụma ebe ọbụla ọ gara, ya mere mmụọ ọma ji eso ndị Igbo.
2. Igba mbọ
I chetara mgbe anyị wetara ụnụ akụkọ onye Igbo na-azụ ahịa mgbuka na Johanesburg.
Ezenwa Ozoigbo dị afọ 30, na-ekwu na mgbe ọ bịara na mba South Afrịka, na echiche na onweghị onye ga-enyere ya aka na mba ahụ mere ya ka ọ gbasie mbọ ike.
Mbọ ọ gbara bụ na ọ na-arụ ọrụ ma na-edowe ego ọ tụkọtara na kom kom rue mgbe o zuru ịmepe ụlọahịa nke ya.
N'ọnụ ya, "Onye Igbo na-eche maka echi makana ọ chọghị ịbụ ohu kwa mgbe mgbe."
3. Ha achọghị ịkụda obi nne na nna ha zipuru ha

Ebe foto si, Nneamaka Etoniru
Onye Igbo ọbụla nwere ezinụlọ o si wee pụta. Ebe ọbụla o mechara nwete onwe ya, ọ gaghị achọ ka ọkụda obi ndị bee ya tụmadị nne na nna ya zipuru ya.
Nke a mere ka Nneamaka Fidelis, onye bụrụla nọsụ na mba Amerịka gwa BBC Igbo na ọ ga-agbagide mbọ bụrụkwuo Dọkinta ahụike na mba ahụ.
4.Nwanne gosi m 'way'
Ọ bụrụ na ị bụ nwafọ Igbo ma ihe a na-akọ, ị ga-anụtụgo okwu 'nwanne gosi m way'.
Ndị Igbo na-enwe anụrị pụrụiche ma ha hụ nwanne ha na mba ọzọ nke a na-emekwa ka ha nyere onwe ha aka.
Ọ bụ agwa hụ bụ ihe bidoro usoro ịgba boy n'ala Igbo nke na-euzi ewu n'ụwa niile.
5.Ha anaghị atụ egwu ilu nwaanyị maọbụ dị na mba ọzọ
Onye Igbo ruo mba ọzọ, ọ dabara ya na nwaokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla, ha lụwa onwe ha.
Ọ ga-amụta ụmụ na mba ahụ na bawanyezi.
6.'I na-enye m nri?'

Ọ rara ahụ ị hụ onye Igbo na-arịọ arịrịọ makana ọdịghị ume ngwu. Kama onye Igbo ga-arịọ gị nrị ikparịa ya, o je kpo nsị ma nara ego ya.
Onye Igbo ga-achọ kiri kiri ọrụ na-arụchara wee na-eche ihe o na-eche ma nwekwa okwukwe na nkiru ka mma.
7. Iwulite akụ na ụba obodo ha bi na ya

Ebe foto si, @kelechiafc
Ndị Igbo anaghị agba "last". Ha ga-achọrịrị imezi obodo ha bi n'ime ya ma soro wulite akụ na ụba obodo ahụ.
Ya kpatara ebe ọ bụla onye Igbo gara ọ ga-edozi ụzọ maọbụrụ na ụzọ adịghị ma rụkwa ụlọ karaaka n'agbanyeghị na ọ bụghị be ya.
Agwa a na-eme ka ndị ha bi n'obodo ha nye ha ohere ịbanye ọchịchị obodo ahụ.
8.Ha na-amụkarị asusụ na omenala obodo ndị ha bi ya
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Onye Igbo ga China, ọ ga-agba mbọ mụta asụsụ na omenaala ndị ọ nọ na be ha, ka ihe na-adabara ha nkeọma.
9. Ị ma aka ziri ezi
Ebe ọ bụla ndị Igbo nọ, ha na-chọ ka ha ṅomie ihe di mma ndị obodo ahụ na-eme nwalee ma ha ga-emeli ya bụ ọkaibe.
Ụfọdụ oge, ka atụmaatụ a na-eweta anya ụfụ mana onye ma ihe ọ na-eme achọghịkwa ịma.
10. Ọnatarachi
Ọtụtụ ndị nọ na soshal midia na-ekwu na ọ bụ ọnatarachị na ndị Igbo ga-atọli ute dịnara ebe ọbụla ha nwetere onwe ha n'ụwa ma sịkwa n'ọnọdụ ahụ mepụta ihe dịmma ga-abara ha uru.
Dọkịnta Chigozie Oguine na-ekwu na ihe nwereike ikpata nkea bụ na ụmụ Igbo nwere okwukwe na Chukwu nwe ụwa niile.
















