Arsenal vs Tottenham: Kama anụ Arsenal ga-agbalahụ ha, ekwobiri ya ọdụ

Ebe foto si, ALLSPORT/Getty Images
Egwu tara akpụ mgbe Arsenal an Tottenham Hotspur pịakọrịtara nkụ n'ọgbọegwu Emirate na mgbede Sọnde.
Arsenal malitere ịzọ onwe ha azọ mgbe Eriksen nke Tottenham tinyere goolu mbụ ha na nkeji 10 amalitechere ya bụ egwu.
Ka a na-ekwu nke a, Kane were penariti tinyere Tottenham goolu nke abụọ ha nke mere ka ụwa gbaa Arsenal gharị n'oke ehihie.
Obi kooro Arsenal n'elu ka Tottehman jidere ya bụ ọnọdụ ruo mgbe achọrọ ịpụ ezumike bụ mgbe ha jiri chiri ọkụ sowe Tottenham n'azụ.
Mgbe ọfọrọ naanị otu nkeji ka oge ezumike kụrụ ọnụ ka Lacazette tinyere otu mpio ndị Tottenham iji mee ka ndị otu ha kuda ume.
Mpempe akwụkwọ ịdọ aka na ntị nwụrụ ọnwụ na ya bụ asọmpị dịka Tottenham ritere ise, Arsenal rite anọ.
Mgbe abatara ya bụ ezuike, Tottenham gbara mbọ ka ha were otu ọkpụ mara ya n'elu were laa mana ume ha ezughị ya dị ka Aubameyang tinyeere ha aja na garị site na-inye otu goolu na nkeji iri asaa na otu bụ nke mere na ike ha ha nhatanha.
Ya bụ egwu bọọlụ biri na Arsenal 2 - 2 Tottenham Hotspur











