Tottenham vs Liverpool : Liverpool asụọla atịkpa fenye Tottenham ajụ n'anya

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ndị na-akwado Liverpool ga-arahụ ụra ka nwa a mụrụ ọhụrụ dịka aka ha mechara kpara iko Champions League ha chụwara kemgbe afọ iri na anọ gara aga.
Dika asọmpi a e ji ama onye bụ dike birila n'etiti Tottenham na Liverpool, anwụrụ bidoro ịpụ Tottenham n'isi mgbe Mohamed Salah ji penariti gbanye ha otu ọkpụ goolu n'ime naanị nkeji abụọ egwu a malitere.
Cheta na Liverpool abụghị ndị ọbịa n'asọmpi a.
Ebe ha burula ya ugboro ise zuru ezu, nke a bụ nke mbụ Tottenham na-erute agba nke ikpeazụ a.
Ka a batara ọkara nke abụọ, egwu bịara sie ike ruo nkeji iri asatọ na asaa mgbe Divock Origi tinyere goolu nke abụọ n'isi mpio ndị Tottenham.
Nke a mere ka ya bụ egwu bie na 2 - 0 bụ nke Liverpool ji maburu ya bụ iko kwara ha afọ 14, mere ya nke ugboro isii aka ha na-emetụ ya.
Mmeri a Liverpool meriri ebunyela onye nchịkọta ha bụ Jurgen Klopp iko mbụ ọ na-ebute kemgbe ọ ji bụrụ onye nchịkọta ha.





