Buhari OIC meeting: Ohaneze Ndị Igbo akatọọla njem Buharị mere na Saudi Arabia

Akụkọ dị mkpa:

Ohaneze Ndi Igbo katọrọ njem Buhari maka OIC

Nnia Nwodo onyendú Ohaneze Ndigbo
Nkọwa foto, Nnia Nwodo onyendú Ohaneze Ndigbo

Ohaneze Ndị Igbo akatọla njem onyeisiala Buhara mere na mba Saudi Arabia ngwa ngwa edochara ya n'iyi ọrụ.

Odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Chucks Ibegbu kwuru na Buharị ga-akọwara ndị Naijirịa ihe mere ojiri bụrụ ọgbakọ ndị otu alakụba akpọrọ Organisation of Islamic Countries (OIC) bụ ihe kacha mkpa iji bido ọchịchị ọhụrụ ya.

Boko Haram akpaala mkpamkpa na Maiduguri

Ndị agha Boko Haram

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Boko Haram kwuru na nkuzi bekee bụ arụ

Na Sajeri dị na Maiduguri, otu ọlụọ ọlaa bụ Boko Haram agbasala ndị ụka alakụba gara ekpere ụtụtụ ma gbuo otu onye n'ime ha.

Akụkọ kọrọ na ọtụtụ mmadụ meruru ahụ ebe ha na-agba ọsọ ndụ ha mgbe ndị omekataraihe pụụjọ a waporo ha.

Akpọpụtala ndị nwụrụ na Virginia

Aha ndị egburu na Virginia

Ebe foto si, AFP

N'ofesi, ndị ọchịchị akpọpụtala aha mmadụ iri na abụọ bụ ndị nwuru n'aka onye egbu ara ọbara na Virgina Beach ụnyahụ.

Mmadụ iri na otu ndị ahụ bụ ndị ọrụ na ya bụ ụlọọrụ ndị okpuru ọchịchị obodo ebe otu onye ọzọ bụ onye ọrụ ngo bịara ebe ahụ.

Okocha gara ụlọikpe Aberdeen

Okocha bụ onye ọgba bọọlụ amaama

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị na-egwu na Nwafọ Igbo eji egwu bọọlụ mara bụ Jay Jay Okocha gara ụlọikpe dị n'Aberdeen, Scotland ịzara ọnụ ya maka ebubo ịbụfe ego mba ofesi n'afọ 2015.

Okocha ekwubeghị ma ọ mere ya ka ọmeghị ya bụ ihe a na-ebo ya.

Nkeji mgbede

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Mwakpo ụlọ obibi gọọmentị dị na Virginia, mba Amerịka.

Ụlọ obibi Virginia Beach

Ebe foto si, Reuters

Otu nwoke ewerela egbe dulaa ihe ruru mmadụ iri na abụọ mmụọ ma merụkwaa ọtụtụ ahụ n'ụlọ obibi gọọmentị dị n'obodo Virgnia Beach nke mba Amerịka.

Ndị uweojii sị na nwoke kpara ike a so n'otu n'ime ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ gbara egbe n'etiti ọha ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na abụọ merụkwa ndị ọzọ ahụ.

Ndị uweojii kwuru na a gbagburu nwoke ahụ dịka ya na ha na-agbarịta onwe ha egbe, mana mkpọ tụrụ otu onye uweojii n'ahụ.

Maap obodo Virginia

Ụbọchị 4 na 5 Juun bụ ezumike

Ụlọ ofufe Alakụba dị na Kano

Gọọmentị etiti ewepụtala ụbọchị Tuzde na Wenezde bụ abalị anọ na ise nke ọnwa Juun dịka ụbọchị ezumike maka oriri Eid-Al -Fitr nke ndị Alakụba.

Nke a pụtara na ndị ọrụ bekee, ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ a gaghị aga ọrụ ma ọ bụ ụlọakwụkwọ n'ụbọchị ndị a.

N'okwu metutarakwara ndị alakụba

Ndị ụka shiites na-eme ngagharịwe

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii na ndị otu Shi'ite chịpụrụ ya ụnyaahụ na Kaduna dịka ndị ha na-eme ngagharịiwe maka ịtọhapụ onyeisi ha bụ El- Zakzaky nke mere ndị uweojii ji gbaa anwụrụ anya mmiri.

N'otu aka ahụ ndị otu a bukwa ngagharịiwe ha wụchie Abuja na-akpọ oku ka gọọmentị tọhapụ onyeisi ha.

N'egwuregwu,

Liverpool na Tottenham

Ebe foto si, Getty Images

Anya ụwa nọ n'obodo Madrid nke Spen ebe a ga-achọpụta otu egwu bụ ọka ibe n'ịgba bọọlụ na Yurope.

Ịma aka a ga-adị n'etiti otu egwu Ịngland abụọ bụ Liverpool na Tottenham.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Ihe Fada Festus Ezeamaka kwuru maka mwakpo awaporo ya.