New Zealand Video: Ụlọọrụ soshal midia na-agbali ịkwụsị nkesa ihe onyonyo nke Brenton Tarrant kesara
Akụkọ ndị dị mkpa taa:
New Zealand Shootings :Aka akparala Brenton Tarrant

Ebe foto si, Reuters
A kpụpụla Brenton Tarrant, onye a na-enyo enyo dika isi a hụrụ kwaba okpu na ihe ọdachi ịgbagbu mmadụ iri anọ na itoolu nke mere n'ụlọụka Alakuba abụọ na mba Nu Ziland ụlọikpe.
Mba ụwa nọ n'anya mmiri dịka e ji egbe gbagbuo mmadụ iri anọ (49) ma merụọ opekata mpe mmadụ iri abụọ n'ụlọụka Alakụba abụọ dị n'obodo ChristChurch dị na mba Nu Ziland n'ụbọchị Fraide.
Otu onye ji egbe so na mkpakpa ahụ nke a na-enyo na ọ bụ Brenton Tarant gosiri onwe ya dịka ọ na-akwa mgbọ n'ime ụlọụka Alakụba.
Ndị ụlọọrụ soshal midia dịka Facebook,Twitter na Youtube agbaliala ị wepụ ihe onyonyo ahụ mana ndị mmadụ ka na-eke ya n'ebe dịa nille gụnyere na Whatsapp. na agbanyeghị na ndị uweojii dụụ ọdụ ka a kwụsị ikesa ya.
Onyeisi mba Nu Ziland bụ Jaccinda Arden katọrọ oke ọdachi mere n'ala ha nke o kwuru na "ụbọchị jọkarịchara" nye mba ahụ.
Otu onye bu egbe nke kpọrọ onwe ya onye Australia aha ya bụ Brenton Tarrant gosiri onwe ya dịka ọ na-agbasasi egbe n'ụlọụka Alakụba Al Noor Mosque.

Ndị uweojii anwuchiela ya bụ nwoke dị ihe dịka afọ iri abụọ nakwa nwoke abụọ ọsọ na otu nwaanyị ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ.
Ndị uweojii dọkwara aka na nti ka ndị mmadụ hapụ ebe okpukpere ụka Alakụba na mba ahụ ganye n'udo alọghachi.
Otu onye nọ ebe o mere gwara ụlọọrụ akụkọ New Zealand na ya hụrụ nwoke ahụ ka ọ gbara otu nwoke egbe n'obi.
"Anọ m na-eche, na-ekpe ekpere , Chineke mee ka mgbọ gwụ n'egbe nwoke a."
Ọ gba egbe ebe, ọ gba ebe o sị n'ọnụmara ụmụnwoke na-ekpe ekpere gaa fee na nke ụmụnwaanyị.
"Anụrụ m na otu nwaanyị na ndị ọ gbatara anwụọla."
_____________________________________________________________________________________________________________________________________
Ụlọ elu ọzọ adaala n'Ibadan
Ụlọ elu ogogo atọ adaala a na-arụ ọhụrụ adaala na Molete dị n'Ibadan nke Oyo Steeti.
Dịka ọ dị ugbua a mabeghi mmadụ ole nke a metụtara dịka ndị ọrụ gbatagbata a bịabeghi n'ebe ahụ dịka @TopsyAshaolu siri kwuo n'akara twitter ya;
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
NEMA anabatala ndị Naịjirịa ọzọ esi mba Libya tụbata

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Ụlọọrụ gbata gbata bụ NEMA n'ịchafụ a nabatala mmadụ dị otu narị na iri asaa na anọ bụ ụmụafọ Naịjirịa esi mba Libya tụbata.
Onye nchịkọta ụlọọrụ a na Legọs bụ Idris Muhammed kwuru na ọnụọgụgụ ndị a ga-eme ya mmadụ puku iri na abụọ, narị ise na iri asaa na anọ atụbatarala.
Onye ga-abụ ọkwụ ọtọ ekene eze n'Uefa Champịọns?

Ebe foto si, Getty Images
Nkeji
NLC katọrọ ka ntuliaka 2019 siri gaa
Otu jikoro ndị ọrụ bụ NLC n'aha ịchafụ akatọọla Inec maka etu ntuliaka 2019 siri gaa ma kpoo oku ka ha hụ na mmegharị ntuliaka na steeti ụfọdụ nke e hiwere n'abali iri abụọ na atọ nke ọnwa Maach gara n'anya ya.
Ekweghị n'ihe Inec mere-Okorocha

Ebe foto si, Rochas Okorocha/twitter
Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na Inec enweghị ikike ị nara ya ọkwa dịka onye a họpụtara ga-anọchịte anya mpaghara Ọlụ n' Ụlọomeiwu Ukwu.
Okorocha, onye kwuru nke a oge ọ na agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja,ụbọchị Wenezde sịrị na ihe na-eme ya sị n'aka ndị na-akpa nkata iji hụ na ọnụ agaghị na-eru ya n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.
Inec wọrọ asambodo mmeri e nyere ndị meriri azọmọkwa sinete ụbọchị Tọzde.
Franfurt agbapụla Inter Milan

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwuEintrachcht Franfurt (entrank frankfot) achụọla Inter Milan ọsọ ụkwụ ete aja n' Europa league dịka ha ji otu ọkpụ gbapụ ha were nweta ọnọdụ n' agba nke abuọ tupu nke ikpeazụ.












