Pope Francis: Onyeisi ụka fada tọrọ na liftu
Pope agbalahụla ọdachị n'ụtụtụ Sọnde

Ebe foto si, EPA
Pope Francis tọrọ na liftu n'ụtụtụ a mgbe ọ na-aga ụka ụtụtụ Sọnde.
Ọ tọrọ ebe ahụ ihe ruru nkeji iri abụọ na ise bụ mgbe ndị ọrụ gbanụgbanụ ịmenyụ ọkụ bịara zọtụta ya ebe ahụ.
Nke a mere ka Pope ghara ị ga ụka n'oge nke mere na-ọrịrịọ ndị bịara ụka mgbaghara maka nke a, ma kelekwa ndị ọrụ mgbanụgbanụ ahụ n'ụzọ pụrụiche maka ị gbakwụte ya mgbe ahụ.
Pope rịọkwara ndị ụka ka ha kelekwa ndị ọrụ ahụ zọpụtara ya na ya bụ liftu o ji agbada na St. Peter's Square maka Anjelusu ụtụtụ.
Akụkọ ndị Bloomberg buru na ọkụ latrik tabiri anya mgbe ya bụ liftu ji nwụọ ọkụ n'ụzọ.
SERAP agbaala ndị omeiwu akwụkwọ

Ebe foto si, Uche Akolisa
Ndị otu kwụụrụ onwe ha bụ SERAP, BudgIT, Enough is Enough nakwa ndị mmadụ karịrị puku isii agbaala ụlọomeiwu etiti akwụkwọ maka akatamkpo ego ha mapụtara iji goo ụgbọala ọhụrụ.
Ha na-arịọ ụlọikpe ukwu dị n'Ikoyi Legọs ka ọkwela ha jiri ego karịrị ijeri Naịra ise goo ụgbụọla bụ nke ha sị na omegidere iwu ala Naịjirịa.
Maka ọrụ ndị uweojii ga-ewe

Ebe foto si, NPF/Twitter
Ndị uweojii ekwusiela ike na ha ga-akwụwa aka ọtọ mgbe ha ga-ewe ọrụ ha sị na ha ga-ewe mgbe adịghị anya.
Onye na ahụ maka mmekọrịta ha na ndị mmadụ bụ Ikechukwu Ani kwere nkwa ụbọchị ụka n'Abuja.
Iwobi ejirila iwe mapụta ihuọgụ

Ebe foto si, Reuters
N'egwurewgwu, Nwafọ Igbo bụ Alex Iwobi nyere otu goolu na goolu atọ Evaton ji merie Wolverhampton Wanderers bụ ndị satara abụọ n'ime ha na asọmpi Premier Lig nke Sọnde.
Nke a bụ goolu abụọ Iwobi na-enye n'izu ụka a.
Nkeji Igbo
Ọdachi na Texas

Ebe foto si, AFP
Ihe ruru mmadụ ise anwụọla ebe ihe ruru iri abụọ merụrụ ahụ dịka otu nwoke bu egbe na-agba ndị ọkwọ ụgbọala na ndị ji ụkwụ aga n'obodo Texas dị na mba Amerịka.
Isi nwoke ahụ lakwara na ya bụ ihe dịka ndị uweojii gbaturu ya oge o rutere na sịnịma ebe o bu n'obi imere na-aga.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Buhari alọtala

Ebe foto si, Twitter/ Bashir Ahmad
Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachitela Naịjirịa dịka nzukọ kpọgara ya na mba Japan bịara n'isi njedebe.
Ọ batara n'abalị ụbọchị 31 nke Ọgọstụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ amachiela ịchị ehi agagharị

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Ndị Gọvanọ steeti niile dị n'Ọwụwa Anyanwụ enweela nkwekọrịta imachi ngagharị ndị ọchiehi, ọkachasị ndị nke na-ebu egbe na mma, na steeti ha.
Ha mere mkpebi a na nzukọ pụrụiche ha nwere n'Enugwu ụnyaahụ, ebe ha nọ kwuo na ndị nchekwa steeti ha niile ga-eso hibe iwu a.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ amachiela ịchị ehi agagharị
N'egwuregwu,
Nwaafọ Igbo bụ Eze Joy Ogbonne, esonyela na ndị Naịjirịa ji aba n'ihe gbasara egwuregwu.
Ogbonne dị naanị afọ iri na ise so na ndị Igbo atọ nwetara ihe nrite ọlaedo site n'ibuli igwe e ji akpụ ụzụ, n'asọmpi African Games bịara n'isi njedebe na Moroko ụnyaahụ.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











