Rochas Okorocha: 'Ipob biko kọwara anyị ebe ụnụ kwụ ka anyị sonyere ụnụ'

Gọvanọ chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụrụ na ndị Igbo ga-enwe ọche onyeisiala n'afọ 2023, ọ ga-doriri ndị ugwu anya.
Ọ rịọrọ ka ndị ntaakụkọ kwụsị ịkpọ ya oche onyeisala ndị Igbo makana o nweghị agbụrụ ọbụla edowere ya iche.
Okorocha kwuru nke a mgbe ọ na-asa ajụjụ ọnụ ndị ntakụkọ ụlọọrụ mgbasaozi 'SUN' gbara ya nso nso a.
Okorocha jụkwara kedụ uru Ipob ga-erite maọbụrụ na ndị Igbo kewapụ onwe ha na Naịjirịa.
N'okwu ya, "ọ bụrụ na ndị isi Ipob azanwụghị ajụjụ a, ọ ga-ahịara ndị isi otu ahụ ịchịkọta ebumnobi ha."

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ruo ugbua ọ mabeghị ebe Ipob kwụ akwụ.
Gbasara okwu na-ese n'etiti ya na gọọmenti Imo steeti ugbua, Okorocha kwuru na ihe gọọmenti Ihedioha na-eme e doghi ha anya.

Ebe foto si, Ihedioha/BBC
O kwuru na ebe a na-ata ya ụta bụ na ọ naghị eke ego.
Gbasara ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu, Okorocha kwuru na o nwere olileanya na ọ ka ga-achị Imo steeti.
Okorocha kwuru na nyocha EFCC na-eme ya adịghị njọ makana ha nyocha, o nweghị ihe ha fụrụ, ha hapụkwa onye ahụ.
Mana ọ na-rịọ ka ndị mmadụ kwụsị ịhụ ndị a na-eme nyocha dịka ekperima.
Okorocha kwuru na okwu na ya napụrụ ndị mmadụ ala n'ike ha n'Imo bụ okpotokpo asị.









