Norwich vs Manchester City: Norwich emeela Man City ka ewu akpụkpa ntị

Ike agwụla Kun Aguero nke Manchester City

Ebe foto si, Getty Images

Norwich abụrụla anụ nkanka mpi dịka ha gosipụtara ike ha na asọmpi ha na ndị Manchester City.

Na agbanyeghi na mmadụ iri ndị otu Norwich merụrụ ahụ, ha jị anya uhieuhie bata asọmpi a.

Ọ bụ Kenny McLean kpuhere ite goolu dịka ọ sunyere otu na nkeji nke iri na asatọ.

Mgbe ọ dị ka ndi ManCity ahụwala ụzọ , ka Todd Cantwell nyere goolu ọzọ na nkeji iri abụo na asatọ were chetara Man City ndị ha nọ n'ụlo ha.

Dịka a na ajụ na Aguero osokwa n'asọmpị a ka o were isi takaa netị ndị Norwich na nkeji iri anọ na ise.

Teemu Pukki gbara ndị Norwich ume dịka ọ sunyekwara goolu ọzọ na nkeji iri na ise.

Goolu Rodri nyere na nkeji iri asatọ na asatọ dịka ManCity enwere olilwanya mana otu awụghị na ezie.

Na ngwucha, mkpọtụ na-ada na Norwich City dika ha jiri ọkpụ goolu atọ asatara abụọ were chulaa ndị Manchester City.

Lee ihe ndị ọzọ gbatara na Premier League taa:

Liverpool 3 : 1 Newcastle

Brighton 1 : 1 Burnley

Man Utd 1 : 0 Leicester

Sheff Utd 0 : 1 Southampton

Tottenham 4 : 0 Crystal Palace

Wolves2 : 5 Chelsea

Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị