Hotel Murders: "Ọ bụ akwụnakwụna na-ebute ogbugbu ndịa" Ndị uweojii

Ụmụnwaanyị Rivers Steeti emeela ngagharị iwe ga kwuru ndị uweojii dika enwetara ozu nwa agbọghọ ọzọ n'ime ụlọ ọriri n'Omoku.
Nke bụ ozu ise a na ahụta na ụdị ọnọdụ a na ụlo oriri na Rivas Steeti n'ime otu ọnwa.
N'ime ọnwa gara aga ka ndị uweojii kwuru na egburu ụmụnwanyị atọ n'ụlọ oriri dị na Pọtakọt ma kowaa kwa na atọgburu abụo n'ime ha.
N'aka nke ọzọ ka osote onyeisi ndị uweojii nke Rivas steeti bụ Chuks Enwonwu gwara umuwnayi a na ha ka na-eme nyocha.
Enwonwu kwukwara na ọ bụ ọrụ akwụnakwụna na ebute mkpamkpa.
Kama nwaada haziri ngagharị iwe a bụ Soibi Ibibo kwuru sị " ọ bụrụ godi akwunakwuna, ndụ mmadụ di mkpa, ha bụkwa madụ"
Enwonwu kọwakwara na ha ejidela ụfodụ ndị maka ogbugbu umunwanyi ndia ma sị kwa na ha na ụlooriri ndi di na steeti ahu na enwenzụkọ maka nkea.
Onyeisiala azọpụla njem
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja taa gaa na nzụkọ pụrụiche nke ECOWAS hibere maka ịlụso otu ndị na-eyi ndụ egwu agha.

Ebe foto si, Getty Images
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu nakwa Minista na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama so ya aga njem ahụ.
N'otu aka ahụ

Ebe foto si, Getty Images
N'otu aka ahụ osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ga-anọchite anya onyeisiala Naịjirịa n'akwamozu Robert Mugabe nke mba Zimbabwe kwadoro ya n'ụbọchị satode.
Cheta na ezinaụlọ Mugabe nakwa gọọmentị ala ahụ nweburu nkenke esemokwu maka ebe a ga-eli ya.
N'akụko ọzo ,
Yemi Osinbajo ekwuola na Gọomenti etiti ga-akpọpụta ndị Naijirịa di otu nari nde site n'aka ubiam pụta.
Osinbajo kwuru nkea mgbe ọ gara ihu Eze Gwandu na Kebbi steeti, ma kwee nkwa na gọọmentị ga-emenwu nkea n'ime afọ iri ma ndị gọomentị steeti tinye aka.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Ide mmriri ataala isi mmadụ atọ n'mba spain dịka oke mmiri ozizo mere ka ikpere mmiri sofee oke ya were nụbata ebe ndị mmadu bi n'obodo Valencia, Murcia na owụwa anyanwu Andalucia.
Gọọmenti spain ezipụla ndị nchekwa n'obodo Valencia, Murcia na owụwa anyanwu Andalucia ebe ide mmiri a kacha akpa ike.

Ebe foto si, Getty Images
Felicity Huffman na-eme ihe onyonyo Desperate Housewives ga-aga ụlọ mkpọrọ ihe ruru abalị iri n'anọ maka nrụrụaka.
Cheta na achọpụtara na Huffman kwụrụ ụgwọ ịgbanwe ule nwa ya nwaanyị ga-enyere ya aka ịbanye Mahadum di ukwu na mba Amerịka.
Goaaaaaaaaaaaaal!

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị taa abụghị ụbochị ọma nye ndị Wolves dịka ndị Chelsea jiri goolu saa ha ahụ.
Ụmụ Naijiria abụọ bụ Tammy Abraham na Fikayo Tomori gbachara aka ahịa ka goolu nọ na-arị ibe ya elu n'egwuregwu a.











