PMBInLagos: Ndị mmadụ na-aba mba na a rụchabeghi ihe ndị Onyeisiala Buhari na-abịa ịgbape

Oshodi Transport Interchange
Nkọwa foto, Foto ọdọụgbọala ọhụrụ n'Oshodi onye ntaakụkọ BBC sere ụbọchị Tusde
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Buhari alaghachịla n'Abuja ka ọ bịara Legọs mana ụfọdụ ndị bi na Legọs na-eti mkpu na soshal midia ka Onyeisiala Muhammadu Buhari na-abịa steeti ahụ ịgbape ọrụ ụfọdụ n'ụbọchị Wednesde.

Ọrụ ndị a gụnyere ụlọọgwụ "Institute of maternal and child health" dị n'Ikeja; ụlọ ifo akpọrọ "Lagos Theatre Oregun"; okporoụzọ akpọrọ "Oshodi Transport Interchange"; ụgbọala ọhụrụ a ga-eji na-ebu mmadụ nakwa ụzọ ọhụru nke e si aga n'ọdọụgbọelu.

Ụfọdụ ndị bi Legọs sị na ọrụ ka na-aga n'ihu n'ọdọụgbọala njem ahụ dị n'Ikeja Onyeisiala bịara gbapee n'afọ gara aga.

Nke pụtara na ọ bụ sọsọ ihe a ka na-arụ arụ juru na Legọs ka Onyeisiala na-abịa ịgbape.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Skip X post, 5

End of X post, 5

Mgbe onye ntaakụkọ BBC Pidgin gara ebe ihe ndị a dị, ọ chọpụtara na ọ bụ eziokwu na ọrụ ka na-aga n'ihu.

Oshodi Transport Interchange
Nkọwa foto, Onye ntaakụko BBC Pidgin kwuru na ọrụ ka na-aga n'ihu na mgbede Tusde
Oshodi Transport Interchange
Nkọwa foto, Ọrụ ka na-aga n'ihu n'ọdọụgbọala Oshodi
Oshodi Transport Interchange
Nkọwa foto, Ọdọụgbọala ahu akpọrọ "Oshodi Transport Interchange"

N'ọdọụgbọala ahụ akpọrọ "Oshodi Interchange Terminal" ọrụ ka na-aga n'ihu mgbe onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ na mgbede Tusde.Ọzọ bụ ụzọ ọhụrụ na-aga Ọdọụgbọelu Murtala Muhammed bụ ebe ọtụtụ ndị ọrụ nọ na-arụ ọrụ. Ọrụ ka bụ aja n'aka dị n'ụzọ ahụ.

Lagos Airport Road
Nkọwa foto, Ọrụ na-aga n'ihu na ụzọ Ọdọụgbọelu Murtala Muhammed

Agbanyeghi nke a, otu onye na-aru ọrụ na gọọmentị Legọs achọghị ikwu aha ya sị na ọrụ ebiela.

Ọ sị; "Na a ka na-arụ ọrụ a abụghị na arụchabeghị, ọkachasị ebe ọ bụ ụzọ ka a na-ekwu okwu ya. Ụzọ agbapeela kemgbe izuụka abụọ. Onyeisiala agaghi abịa ịgbape ụzọ arụchagbeghị"

Ụzọ ọhụrụ Ọdọụgbọelu

Ebe foto si, Lagos State goment

Nkọwa foto, Foto ụzọ ọhụrụ onye enyemaka aka na-achị Legos zitere BBC Pidgin
Oshodi Terminal
Nkọwa foto, Foto "Oshodi Terminal" gọọmentị Legọs zitere
Foto ụgbọala ọhụrụ legọs steeti gotere
Nkọwa foto, Foto ụgbọala ọhụrụ legọs steeti gotere
Foto "Ayinke house" dị na LASUTH

Ebe foto si, Lagos State goment

Nkọwa foto, Foto "Ayinke house" dị na LASUTH

BBC enwetaghi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi mana ekwentị ya akụghị.

Kọmịshọna nke ọrụ asabeghi "email" e zigaara ya.

Akụkọ ga-amasị gị: