West Ham vs Man. City: Man. City afọnyela West ham n'akpa

Gabriel Jesus nyere goolu megide ndi West Ham

Ebe foto si, Rex Features

Ka afọ ọhụrụ na-ebido n'asọmpị Premier Lig, otu Man City egosila West Ham na ogologo abụghụ na nwa m etoo.

Ha jiri ọkpụ goolu ise asataghị kama otu chọọ neeti ndị West Ham mma mgbe ha zutere onwe ha.

Gabriel Jesusu nyere goolu mbụ na nkeji 25 ebe Sterling so ya n'azụ na nkeji 50 na nkeji 75.

Aguero ji penariti nye goolu nke anọ na nkeji 86 ebe Sterling mechiri akwụkwọ na nkeji 91.

Raheem Sterling nyere goolu atọ pụtara 'Hatrick' n'asọmpị ahụ

Ebe foto si, Reuters

Nke a mere na Manchester City nọ n'ọnọdụ nke mbụ n'ọkwa ehibere maka asọmpị Premier Lig.