Community Shield: Man City ejirila Liverpool gbaa aka ahịa ụtụtụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu bọọlụ Manchester City egosila ihe ha jiri bụrụ ọkaibe dịka ha buliri iko "Community Shield" n'ụbọchị Sọnde.
"Community Shield" bụ asọmpi na-amalite afọ "premier League" ọhụrụ na mba England.
Raheem Sterling bidoro ebe ọ kwụsịrị n'afọ gara aga mgbe ọ gbakpuru otu goolu na nkeji iri na abụọ.
Mana Joel Matip sara goolu ahụ na nkeji iri asaa na asaa nke mere ka egwu baa na penariti.
Ochee goolu ndị Man City bụ Claudio Bravo chere penariti nke Georginio Wijnaldum gbara ebe Gabriel Jesus gbakpuru penariti nke nyere Man City mmeri.

Ebe foto si, Reuters
Cheta na ọbụ Man City tuuru ugo na asọmpi "Premier League nke afọ gara aga, ebe Liverpool mabutere iko "Uefa Champions League".
Afọ ọhụrụ nke egwuregwu bọọlụ nke mba England ga-ebido n'izuuka na-abịa abịa.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










