Manchester City eburula iko Premia Lig

Man City na premia lig

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Man City a nọrọla na be ha buo Iko Premịa Lig taa

Eze ọchị wara Pep Guardiola tata mgbe Manchester City tukwu n'ụlọ be ya mgbe chi ha bunyere ha iko Premia Lig.

Ilu ndị Igbo na-atu sị na "Osisi kpọrọ nkụ a na-atụ anya ọdịda, nke dị ndụ buru ya ụzọ daa" bịara na nmezụ taa n'aka ndị West Brom na Manchester United.

Ọ bụ ihe ịtụnanya mgbe otu egwu bọọlụ West Brom meriri Manchester United be ha tata.

Mmeri a mere ka Man U na-agbabu ndị nke abuo were pọint iri na isii dachie azụ nke bụ na ha merigodi asọmpi ise ha nwere n'ihu, ha agaghị esi iko Premia Lig imi.

Nke a bụ ugboro atọ ndị Man City na esusu iko Premia Lig ọnụ na ugboro asaa ha zọgoro ya bụ iko.

Ha gosiri ọkaibe site na ịnye goolu 93 ebe emeriri ha nanị ugboro abuo.

Nke a bụ iko iri abuo na anọ (24) Pep Guardiola bụbu onye nkuzi ndị Barcelona na Bayern Munich ritegoro kemgbe o bidoro kuziwa bọọlụ.

Ya bụ nwa amadị gbara afọ iri anọ na asaa (47) ebubola iko lig na Spen, Jamani nakwa Champịọns lig ugboro abuo bu nke ya na Barcelona butere.

Kemgbe Sheikh Mansour bin Zayed Al Nahyan gooro otu bọọla Man City, ha ebutela iko asaa chara anya, tinyere iko FA nakwa nke FA Community Shield.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: