Man City nọ n'ụlọ buru iko Premia Lig
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Man City tukwu n'ụlọ merie Premia Lig

Ebe foto si, Getty Images
Newcastle meriri Arsenal n'asọmpi ya taa

Ebe foto si, New Castle/Facebook
N'egwuregwu, Newcastle ji ọkpụ goolu abuo asatara otu (2-1) wee merie Arsenal n'asompi a gbara taa.
Arsenal bu uzo nye goolu tupu Newcastle asaa ya, were nyekwa nke ha jiri nweta mmeri na ya bụ asọmpi.
Ndị agha oshimiri mba Ghana jidere ụgbọmmiri mmanụ agbịdị ndị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha oshimiri mba Ghana akparala ụgbọmmiri ahịaiwu mmanụ agbịdị ndị Naịjiria.
Ụgbọmiri ahụ bu mmadụ iri na otu (11) ma burukwa mmanụ ruru metrik tọn narị atọ na iri abụọ (320).
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Ndị Edo Steeti anwụchiela ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị steeti Edo bụ Godwin Obaseki, anwụchiela ndị ọchịehị n'obodo abuo na steeti ahụ.
Obaseki hibere komitii gbata gbata ga-enyopu ebe ndị ochịehi n'ime ọhia ma kpụgara ha ndị uweojii.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Onye nnọchite anya US n'ọgbakọ otu mba uwa bụ UN bụ Nikki Haley, ekwuola na mba ha agaghị esi na Syria pụta ma ebum n'obi ha emezughị.
Ime ka Syria kwụsi iji ngwọagha kemikal gbuo ndị be ha so n'ihe Nikki Haley kwuru bụ ebumnobi ndị US.
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe nkịrị nke taa
Ihe onyonyo a gosiri ụmụ Igbo na-agba mbọ na Ladipo, Legos.











