Enugu state: Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugwu steeti

Nnukwu ọdachi gaara ata isi ọtụtụ mmadụ bụ nke e gbochiri n'ụtụtụ ụbọchị 25 nke Ọktoba 2019.
Nke a malitere oge tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma wụsachaa ihe o bu n'ebe ụzọ adịghị mma n'Ọnyeama, Enugwu.
Ngwa ngwa ya bụ ihe mere, ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ n'Enugwu steeti jiri akụrụngwa Kemikal eji egbochi ọkụ wụsasịa n'elu ya bụ mmanụ ụgbọala na-awufu nke mere na ọkụ amaliteghị gbawa.

Ka ọ dị ugbua, ogologo ụzọ awara awara Ọnyeama ahụ bụ nke mebiri emebi nke ukwuu, nke kpatara na akụkọ ụgbọala ịda ebe ahụ bụ ihe na-eme kwa mgbe kwa mgbe.

Mgbe BBC rutere n'ebe ahụ, mmanụ ụgbọala ka na-esi ebe niile ebe ndị nwe ya bụ ụgbọala tanka na-agbapụ ya nwayọ nwayọ.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:





