Nigerian Weddings: 'Enweghị ihe m ji nwaanyị Naịjiria eme kemgbe m nụchara ụtọ nwaanyị ọcha a'

Isa Sulaiman na Janine Sanchez nọ ala

Isa Sulaiman Panshekara dị afọ 26 chọrọ ịlụ Janine Sanchez bụ nwaanyị Amerịka dị afọ 46 gwara BBC na o nweghi ike ịhụ nwaanyị Naịjirịa n'anya ka ọ nụchara ụtọ nwaanyị a.

Gịnị kpatara nke a? "Eziokwu bụ na ụmụnwaanyị anyị amaghị ihe bụ ezigbo ịhụnanya, ma ọ bụghị na ha na-achọ ihe n'aka gị, ọ bụrụ na ogbu oge nwere 'plan'.

Mana nwaanyị onye ọcha gwa gị na ọ hụrụ gị n'anya, nwanne, o si ya n'ala ala obi."

Isa bụbụ ọkpụisi kwuru na obere ụjọ bara ya ahụ mgbe ndị Hisbah na ndị ọrụ nchekwa DSS kpọtara ya n'ụlọọrụ ha, mana ọ garuru ọ bụrụ ndụmọdụ ka ha nyere ya n'ihi etu ndị ntaakụkọ si ebugharị akụkọ ya.

Isa na Janine zutere onwe ha n'Instagram ebe otu afọ gara aga.

"Anyị zutere mgbe m malitere iso ya n'elu Instagram, o tinye foto ya m binye ya aka mmasị m. Mgbe obere oge gatụrụ, m bịa hụ na ụfọdụ ndị a na-eme 'Yahoo yahoo' na-achọ igwu ya chandum, m bịa zigara ya ozi sị ya gbachikwa ndị ahụ nkịtị.

"Nke ahụ abịa mee ya ka ọ hụ na mbụ onye buuru ya ihe ọma n'obi. Ọ bụ nke a mere ka ọ malite inwe mmasị ebe m nọ mgbe ahụ.

"Anyị si ebe ahụ malite ịkpa ọfụma, na-akpa nkata site n'onyonyo nke ekwentị. Nke ahụ niile kpọtara anyị ebe anyị nọ ugbua."

Isa Sulaiman na Janine Sanchez kwụ ọtọ

Ịza ajụjụ a jụrụ ya ma ha abụọ ehiela n'otu imeụlọ kemgbe Janine chọrọ ya bịa Kano ụbọchị isii gara aga, o kwuru sị:

"Anyị anaghị araghụ n'otu imeụlọ, mụ na ya na-anọgide chi ejie tupu m sị ya ka chi foo. Naanị nke obere a anyị na-eme (ịmakụ onwe anyị na ijide aka) ndị mmadụ na-ekwu okwu ka ọ fọdụzịa ịlaba n'otu imeụlọ."

Isa kwuru na ezinaụlọ ya ekwetela ka ọ lụọ Janine, nke bụ na ha ga-agba akwụkwọ na Maachị afọ 2020 a, tupu ya na nwunye ya akwakọrọ lawa mba Amerịka.

"Anyị gbachaa akwụkwọ n'ọnwa Maachị site n'amara Chineke, anyị ga-ala mba Amerịka ebe m ga-achọta ọrụ, laghachị ụlọakwụkwọ, makana m kwụsịrị na sekọndrị. Ebukwa m n'obi ịchọta otu egwuregwu m ga na-agbara."

Aha onyonyo, Aeroplane House: Nwoke ji maka ịhụnanya rụọ ụlọ ụgbọelu

Janine na onwe ya kwuru sị na ọ bụ mbụ ya ịbịa Afrịka, ma kwuo na obi dị ya ụtọ maka etu ndị mmadụ si eleta ya.

O kwukwara sị: "Ezutela m ihe karịrị mmadụ 100 n'ime ezinaụlọ ya, obi na-atọ m pọlịna pọlina na ha niile ekwekọrịtala ka anyị lụọ. Ọtụtụ n'ime ha ahụtụbeghi nwaanyị ọcha, ha bịara na-emetụ ntutu m aka, na-ejide m aka."

Janine bụ osiite na Kalifonịa sị na ọ na-alaghachị Amerịka na Febụwarị tupu ọ lọghachị na Maachị maka agbamakwụkwọ ya.

"M na-alaghachị azụ n'ọnwa na-abịa, m ga-alọghachịte na Maachị maka agbamakwụkwọ anyị tupu mụ na ya akwakọrọ laghachi Amerịka."

Na ngwụcha, Isa sị na ịhụnanya ya na Janine gosiri na ịhụnanya ziri ezi ka dị n'elu soshal midia, ma gwa ndị mmadụ gaa nwaa ike ha.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, I nwereike ịhapụ soshal midia n'otu ụbọchị