Odion Ighalo anatala akpụkpọụkwụ ọlaedo ya sị Nigeria 'ngwanụ ọ ga-adị'

Odion Ighalo

Ebe foto si, AFP

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Odion Ighalo edepụtala n'ebe a ka ụgbọ ịgbara Super Eagles nke Naịjirịa bọọlụ ga-ebusa ya.

Ighalo gbaara Naịjirịa bọolụ afọ ise bido na 2015 ruo ọnwa Julaị 2019, kwuru na ọ nwaala ike ya, ma kwuo na ọ chọrọ inyere ndị na-etolite etolite ohere igosi onwe ha.

O kwuru na obi dị ya mma ịnọchite enya Naịjirịa n'asọmpị, na ịhụnanya ndị mmadụ gosiri ya ka ọ na-agba bọolụ riri ya ọnụ, na ọnụ ya jukwara n'ekele.

N'elu akara soshal midia ya ka ọ nọ kwuputa ihe ndị mmadụ nọ na-atamu na nzuzo; nke bụ na ọ zaala aha nna ya ọfụma.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

O kelekwara ndị otu ya nakwa onye nchịkọta Naịjirịa bụ Gernot Rohr, maka ohere o nyere ya iso gbaa asọmpi a mere ya nke ngwụcha ya.

Cheta na Ighalo dị afọ 26 mgbe Daniel Amokachi họpụtara ya ka ọ malite ịgbara Naịjirịa bọolụ.

Ighalo

Ebe foto si, AFP

Ihe ndị ị ga-eji cheta Ighalo:

Ighalo emetela ọtụtụ ihe agaghị eji echefu ya na Naịjirịa, ma ndị ọma ma ndị "ọjọọ".

  • O nwetara ihe nrite akpụkpọụkwụ ọlaedo maka ịbụ "ụkwụ kacha nye goolu" site na goolu ise o nyere n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ 2019.
  • O so Naịjirịa rite ọlanchara n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke 2019.
  • O nyere goolu asaa nke nyere aka mee ka Naịjirịa tozuo ịga asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ 2019 dịka ha aganwughi nke 2015 na 2017.
  • Ọ bụ onye nke asaa n'ime ndị kacha nyere Naịjirịa goolu n'ụwa tụ ụwa.
  • N'agbanyeghi na ọ gbaara Naịjirịa naanị ugboro 35, o nyere goolu 16.
  • Ọ naghị eji ofufe ya dịka onye nke Kraịst egwu egwu, ndị otu ya ga-agwa gị nke a; o nyehaala goolu, etu o si aṅụrị bụ ichili aka n'eluigwe.
Ighalo

Ebe foto si, AFP

Nke "ọjọọ"

  • O riwara ụmụ Naịjirịa obi oge Super Eagles zutere Ajentina n'asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2018, mere ka Ajentina gbapụ Naịjirịa ma mee ka a kpọọ ya na ezinaụlọ ya iyi makwa na-esu ha mmụọ.
Aha onyonyo, Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu