Tranmere Rovers vs Man United: Manchester United azaala 'Nna m agụ' taa

Manchester United

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

A sị na onye hụ onye ọ ka ike, ọ dị ya ka a ga-asị ya gbuo ya.

Manchester United zutere ndị Tranmere Rovers n'asọmpi FA ma were ọkpụ goolu isii asataghị otu merụọ ha ahụ.

Tupu e gbuo pịọm, Man United si n'aka Phil Jones nye goolu mbụ na nkeji 10.

Na nkeji 13 tupu ndị Tranmere amara ihe egwu na-akụ Man United mezuru ya abụọ n'aka Harry Maguire.

Goolu malitere izo ka mmiri na neeti ndị Tranmere na nkeji 16, 41, 45, na 56.

Ụdị mmeri a Manchester United meriri Tranmere Rovers dị ka a ga-asị na ha akpala ike ka 'nna m agụ'.

Ihe karịrị mmadụ 195 na-arịa iba Lassa na Naịjirịa

Ndị ahụ na-arịa

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi nfesasi ọrịa na Naịjirịa akpọrọ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwetela na ihe ruru mmadụ otu narị n'ụma na-arịa iba Lassa na steeti iri na otu.

Ha kwukwara na mmadụ iri abụọ na itoolu anwụfuola maka ọrịa a.

Onye isi NCDC bụ dọkịnta Chikwe Ihekweazu depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara nso nso a iji kowapụta etu nfesasi ọrịa ahụ si arị elu na steeti dị iche iche na Naịjirịa.

Akwụkwọ ozi ahụ kwukwara na pasenti iri asatọ na itoolu(89%) ndị ọrịa iba Lassa ji si na Ondo, Edo nakwa Ebonyi.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Kano sokwa n'ihi na Ihekweazụ depụtara na mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Dọkịta Osagie Ehanire na ndị otu ya gara na steeti ahụ mgbe ha nụrụ na ndị ọrụ ahụike abụọ nwụrụ maka ọrịa ahụ na steeti ahụ.

Lekwa ihe ndị ọzọ o kwuru na ngalaba ahụ na-eme maka ichekwa ụmụ Naịjirịa

Mkpa mkpa Coronavirus na-akpa na China

Coronavirus

Ebe foto si, AFP

N'otu aka ahụ onyeisiala mba China Xi Jinping na-eti na ọrịa coronavirus ji ọsọ na ije efesasi na mba ahụ.

O kwuru nke a n'ọgbakọ iji nabata afọ ọhụrụ ma na-eti na mba ya na-agabiga ọnọdụ dịka ili ọtụtụ mmadụ n'otu mgbe.

Leah Sharibu a mụọla nwa?

Leah Sharibu

Ebe foto si, TheCable

Ruo ugbua, onwebeghị onye be Leah Sharibu bụ nwata ụka Christ ndị Boko Haram tọrọ kamgbe afọ 2018, pụtaralanụ kwuo ma akụkọ na-efegharị na Sharibu mụrụ nwa n'aka ndị ntọ ya a bụ eziokwu maọbụ asị.

N'egwuregwu,

CHELSEA

Ebe foto si, Getty Images

Chelsea mere ihe a tụrụ anya n'aka ha n'asọmpị iko FA dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie otu Hull City mgbe ha zutere onwe ha.

Chọpụta ka Mancity na Fulham nakwa otu egwuregwu ndị ọzọ ga-esi chịpụ ya n'asọmpị a taa.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-akpalite mmụọ gị

Aha onyonyo, Ọgba Mbọ: Ịrụ mesịn na-amasị m - Nwaanyị na-arụ mesịn