Barcelona vs Chelsea: Akọọla Barcelona ka ncha nkọta

Tammy Abraham

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị Chelsea tiri Barcelona mmọnwụ ka ha na Barcelona zutere n'egwuregwu enyi na enyi ha gbara taa bụ Tuzde, ụbọchị 23 nke ọnwa Julai, 2019.

Goolu abụọ Tammy Abraham na Ross Barkley nyere zuru inye ha mmeri, n'agbanyeghi na Ivan Rakitic mechara sata otu.

Abraham bụ nwaafọ Naịjirịa e binyeburu ndị Derby County (bụ ebe onye nchịkọta Frank Lampard si gafete Chelsea) bu ụzọ gbakaa neetị na nkeji 34.

Barkley tụkwasịrị ọzọ na nkeji 81, iji gosi Barcelona na ha ga-emerinwu ha n'agbanyeghi na onye egwu ha bụ Lionel Messi esoghi gbaa.

Rakitic

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Rakitic nyere nke ya na nkeji 90, mgbe anọzị n'egwu ụla, ka e mechara tinykwuoro ha nkji abụọ.

Ha zutere n'asọmpi akpọrọ Iko Rakuten, nke ndị mba Japan ebe ụlọọrụ Rakuten dị hibere maka ịgba bọọlụ ndị enyi na enyi tupu afọ egwuregwu bọọlụ ebido n'ike na ebube.

Chelsea zọrọ Barcelona ojukwu n'agbanyeghi na ndị ọhụrụ Barcelona zụtara dịka Antoine Griezmann, Pulisic na ndị ọzọ so gbaa.

Iko Rakuten

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Egwuregwu a wetara "pre season" bụ egwuregwu ndị klọb na-agba tupu a malite afọ bọọlụ ọhụrụ nke Chelsea n'isi njedebe

Dịka ndị klọb niile na-ahọpụta mba ha ga-anọ agba asọmpi nke ha kwa afọ, Chelsea họpụtara mba Japan iji eme nke afọ a.

Lee ihe Chelsea dere n'elu Twitter ha:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Lekwa ihe nke Barcelona dere na nke ha:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ