Neymar arịọla ekpere maka ịwaahụ ya na-abịa n'ihu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị dibia bekee otu egwuregwu Paris St-Germain ekwuola na ha ga-awa Neymar ahụ n'ala Brazil.
Cheta na Neymar gbajịrị ụkwụ n'asọmpị iko nke French n'ụbọchị ụka gara aga oge ha meriri Marseille otu ọkpụ asataghị ihe.
Maka ihe a, Neymar anaghị eso n'asọmpị PSG na Real Madrid n'ụbọchị isi n'ọnwa nke a.
Nna Neymar kwukwara na ọ gaghị agba bọọlụ ọbụla n'izuuka ma ọ bụ asatọ.

Ebe foto si, Getty Images
PSG kwuru na ịwaahụ a ga-eme na ngwụcha izuụka nke a.
Ha ji nde dọla narị abụọ nwe zụụ Neymar n'aka Barcelona n'ọnwa Ọgụsụtụ.
Ugbua o nyeela goolu rụrụ iri abụọ na itoolu n'ime asọmpị iri atọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:





