Lagos Explosion: E butela ozu mmadụ iri na ise n'ọdachị dara na mpaghara Abule Ado, Lagos

Oku gbara na mpaghara Festac, Legós
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ahụla ozu mmadụ iri na ise na ọdachị dapụtara na mpaghara Abule Ado nke dị nso na Festac Town dị na Legọs.

Ibrahim Farinloye bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba gbatagbata bụ National Emergency Management Agency gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nke a.

Farinloye kwuru na ha na-agbakwa mbọ ịzọpụta otu nwa ọhụrụ tọrọ n'otu ụlọ dara ada.

Ndị ọrụ Nigerian Red Cross agwabụọla onye ọrụ BBC bụ Jesica Nwankwo na ndị ọrụ ha zọpụtara ụmụakwụkwọ iri na isii n'ime ụlọakwụkwọ ha ebe ya bụ ọkụ na okeụzụ kpara ike taa na Festac dị n'ime legọs Steeti.

Ụmụakwụkwọ ahụ a zọpụtara na ya bụ ụlọakwụkwọ, Bethlehem Girls' College, bụ nke ya bụ okeụzụ gbajara, na-anata ọgwụgwọ ụgbụ na ụlọọgwụ dị nsọ ebe ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Akụkọ ọzọ na-ekwukwa na onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ dara ada n'okirikiri ebe ihe a mere so na ndị nwụrụ na ya bụ ọdachi.

Mana BBC Igbo enweghịike ikwu ma nke ahụ o mere eme n'ezie n'ihi na ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbatagbata ekwebeghị ekwu okwu maka ya.

Aha ụlọakwụkwọ a bụ Bethlehem Girls College Abule Ado.

Ọ bụ ndị ụka Katọlik nke Legọs steeti nwe ya bụ ụlọakwụkwọ.

Ọtụtụ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ ka a zọpụtara mgbe ụlọ ahụ dara.

Ndị ọrụ Lagos State Emergency management Agency kwuputara na ya bụ ọkụ na okeụzụ bidoro n'okporoigwe gasi bụ nke gbapere ọnụ.

Ya bụ okeụzụ gbariri ọtụtụ ụlọ dị nso ebe ahụ nke mere ka ndị mmadụ agba ọsọ ndụ ha.

Ụlọ ndị mmadụ ya bụ okeụzụ na gbajara
Nkọwa foto, Ụlọ ndị mmadụ ya bụ okeụzụ gbajara na Festac dị na Legọs

Ndị ọrụ nchekwa na nyekwa aka ebuputa ọtụtụ mmadụ n'akụkụ ebe ya bụ ihe mere iji gbochie ọnwụ ma ọ bụ mmeru ahụ ndị ọzọ.

Ndị uweojii, LASEMA nakwa ndị ọrụ ọkụ juru ịtupuru ndị ọrụ anya ọnụ maka na ha sị na aka ha ka dị n'ọrụ.

Abule Ado

A na-eche na ọtụtụ mmadụ anwụọla na mpaghara Festac dị na Legọs a na-akpọ Abule Ado dịka igwe na-ebu gassị nwuru ọkụ ma gbaa ka ogbunigwe n'ụtụtụ Sọnde.

Ebe a mberede a mere dị n'okpuru ọchịchi Amaọdofin.

Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ebe ahụ n'akọwa na-ana eme nyocha ka achọpụta ụdịrị mmanụ igwe ahụ bụ.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ndị ọrụ gbata gbata dị iche iche nọkwa ebe ahụ.

Ọkụ Abule Ado

Ọtụtụ ndị bi n'etiti ọdachị a dara na-akọwa na ọ dị ka ọ bu ogbunigwe gbara.

Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na soshal midia a na-eche si ebe ihe mere na-egbosi ọtụtụ ụlọ ọmetụtara.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Otu ụlọakwụkwọ dị ebe ahu dara maka igwe gassi a gbara ka ogbunigwe.

Eluụlọ dị n'okirikiri ebe ahụ kụsasịrị
Nkọwa foto, Eluụlọ dị n'okirikiri ebe ahụ kụsasịrị

Ya bụ ihe metụtakwara ọtụtụ ụlọ dịkwa n'okirikiri ebe ahụ, kụsasịa elu ụlọ niile.

Ndị nwere ụlọahịa n'akụkụ ebe ahụ gbatara ibupusị ngwaahịa ha.

Ndị mmadụ na-ebupu ngwaahịa ha
Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbataraibupusị ngwaahịa ha

Ndị ọrụ uweojii na-ahụ maka ogbunigwe bịakwara ịmata ka ọ bụ ogbunigwe gbara n'eziokwu.

Ndị uweojii
Nkọwa foto, Ndị uweojii
Akara ntụ-ntụ

Onye a na-enyocha maka coronavirus n'Enugwu ebughi ya - NCDC

Úlógwú Parklane, Enugwu

Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bu nke Bekee kpọrọ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwola na nwaanyị ma maka otu onye n'Enugwu a na-enyocha iji chọpụta ma o bu coronavirus.

N'ozi ha dere n'akara Twitter ha, NCDC sị na onye aahu nọ n'ebe a na-edewe ndị a na-enyocha dịka a na-ache mpụtara nyocha e mere ya.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

A na-eche na mpụtara nyocha ahụ ga-apụta na Sọnde bụ ụbọchị 15 nke ọnwa Maachị.

Akara ntụ-ntụ

Kenya emechiela ụlọakwụkwọ n'ihi cioronavirus

Uhuru Kenyatta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Uhuru Kenyatta machikwara ndị si mba ebe coronavirus na-akpa ike ịbata mba Kenya

Mba Kenya emechiela ụlọakwụkwọ niile dị na mba ahụ iji gbochie mgbasa ọrịa coronavirus, dịka mmadụ abụọ ọzọ butere ya bụ ọrịa.

Onyeisiala Uhuru Kenyatta nyere iwu a n'ụbọchị Sọnde

Ebe mba Ethiopia ekwuola na mmadụ atọ ọzọ ebutekwala ya bụ ọrịa tinyere.

Cheta na otu onye mba Japan bubatara ọrịa ahụ n'Ethiopia abalị abụọ gara aga.

Trump enweghi coronavirus

President Jair Bolsonaro (R), along with his Press Secretary, Fabio Wajngarten (2-L, partially obscured), during a meeting with US President Donald Trump (L), at the Mar-a-Lago residence in Palm Beach 7 March 2020

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Fabio Wajngarten (onye abụọ site n'aka) ịcha kwụ n'azụ Trump oge ya na onyeisiala Brazil bụ Jair Bolsonaro zutere. Wajngarten bu nje coronavirus

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump achoputala na o bughi nje coronavirus.

Trump mere nyocha ịmata ma o bu ya bụ nje dika ụfọdụ n'ime ndị Brazil zutere chopụtara na ha bu ya bụ nje.

Dọkịta na-elekọta Trump na obi gọọmentị Amerịka bụ Sean Conley sị na ya amatara na nyocha emere Trump gosiri na o bughi ya bu nje na abanwanye na mba ụwa.

Jamanị akpọchiela okeala ha

Jamaní ga-emechi oke ala ha n'ihi coronavirus

Ebe foto si, EPA

Mba Jamani ga-akpọchi oke ala ha na Fransị, Swizaland na Ọstrịa malite n'ụbọchị Monde n'ihi coronavirus.

Nke a na-abịa dịka mba Ọstrịa machiri ọgbakọ ọbụla ga-akarị mmadụ ise n'ihi otu okwu ahụ.

Paul Pogba

Ebe foto si, Getty Images

N'aka nke ọzọ, Paul Pogba, ọgbaa bọọlụ ndị Manchester United amalitela atụmatụ ntụkọta ego iji nyere ụmụntakịrị butere ọrịa coronavirus aka.

Nke a bụ etu Pogba si mee emume ncheta ọmụmụ ya dịka ọ gbara afọ iri abụọ na asaa.

Akara ntụ-ntụ