Newcastle vs Chelsea: Newcastle esepụla Chelsea ara n'ọnụ

Callum Hudson-Odoi

Ebe foto si, Getty Images

Chelsea gbara bọọlu niile mana ndị Newcastle nyere goolu kacha mkpa.

Mason Mount gbara mbọ ya niile ịhụ na ha nwetara mmerị mana ọmutaghị mkpụrụ dịka ndị Newcastle tinyere uchu na nchekwa ọnụ goolu ha nke mere na Chelsea enweghị ike inye ha goolu.

Czech na onwe ya gosiri ihe oji bụru dike dịka ọ gbara mbọ hụ na enweghị bọọlụ ndị Chelsea gafere ya.

Ọ dị ka olileanya a dị mgbe ewepụru Tammy Abraham were tinye Batshuayi mana otu awụghị eziokwu.

Ọ mgbe nkeji atọ ka egbuchie asọmpi a ka ndị Newcastle nwetere ohere ịgba 'Corner' nke Issac Hayden jị isi were takaa netị ndị Chelsea.

Ezigbo mmemme ga-ada na Newcastle taa n'ihi na mmerị ha tụrụ mmadụ niile n'anya.

Mana ndị Chelsea, ụnụ dibe na ndịdi amara go ụnụ ahụ.